Deuteronomy 33 (BOICB)
1 Nke a bụ ngọzị Mosis, onye nke Chineke, jiri gọzie ụmụ Izrel, tupu ọ nwụọ. 2 Ọ sịrị,“ONYENWE ANYỊ si nʼugwu Saịnaị bịa,ọ waliteere ha site nʼugwu Sia,o nwupụtara site nʼugwu ParanYa na igwe ndị nsọ so bịasite nʼakụkụ ndịda, site nʼala ala ugwu ahụ. 3 Nʼezie, ọ bụ gị na-ahụ ndị mmadụ ahụ nʼanya,ndị nsọ ahụ niile dị gị nʼaka.Nʼụkwụ gị ka ha na-ada kpọọ isiala,gị na-akụziri ha ihe, 4 iwu ahụ Mosis nyere anyị,ihe onwunwe nke ọgbakọ Jekọb. 5 Ọ bụ ya bụ eze na Jeshurun,mgbe ndị ndu ndị mmadụ zukọrọha na ebo niile nke Izrel. 6 “Ka ebo Ruben dịrị ndụ ghara ịnwụ,ma ka ọnụọgụgụ ndị ikom ya dịrị ole na ole.” 7 Ihe a ka o kwuru banyere Juda,“Nụrụ, ONYENWE ANYỊ, akwa Juda,kpọlata ya nʼebe ndị ya nọ.Aka ya ka o ji alụrụ onwe ya ọgụ ichebe ihe o bu nʼuche.Bụụrụ ya onye inyeaka megide ndị iro ya.” 8 Banyere Livayị o kwuru sị,“Urim na Tumim gị dịịrịohu gị ahụ kwesiri ntụkwasị obi.Ị nwara ya ọnwụnwa na Masa,gị na ya sekwara okwu na mmiri Meriba. 9 Onye ahụ lere nne na nna ya anya sị,‘Ejighị m ha kpọrọ ihe.’Ọ gụnyeghịkwa ụmụnne ya dịka ndị ọ maara,ọ nabatakwaghị ụmụ nke aka ya.Ma o debere okwu gị,cheziekwa ọgbụgba ndụ gị. 10 Ọ na-akụziri Jekọb ikpe gị,na-akụzikwara Izrel iwu gị.Ọ na-achụkwa aja ụda na-esi isi ụtọ nʼihu gị,na-achụkwa aja nsure ọkụ nʼebe ịchụ aja gị. 11 Gọzie akụnụba ya ONYENWE ANYỊ,ka ọrụ aka ya bụrụkwa ihe na-atọ gị ụtọ.Tijie ụkwụ ndị niile na-ebili imegide ya,tigbuo ndị iro ya ka ha ghara inwe ike ibili ọzọ.” 12 Mosis kwuru banyere ebo Benjamin sị,“Ka onye ahụ ONYENWE ANYỊ hụrụ nʼanya zuru ike na-atụghị ụjọ nʼime ya.Nʼihi na ọ ga-ekpuchi ya ogologo ụbọchị niile.Ọ bụkwa nʼetiti ubu ya abụọ ka onye ONYENWE ANYỊ hụrụ nʼanya na-anọ.” 13 Banyere Josef o kwuru sị,“Ka ONYENWE ANYỊ gọzie ala ya,ya jiri igirigi dị oke ọnụahịa nke eluigwe dị nʼelu,na ogbu mmiri dị nʼokpuru ala, 14 na ihe ọma niile anyanwụ na-eweta,na ihe ọma niile ọnwa na-ewepụta, 15 na onyinye ọma niile si nʼugwu ukwu ochie,na ịba ụba ugwu ebighị ebi ndị ahụ, 16 na onyinye ọma niile si nʼala na uju ya niile,na ihuọma onye ahụ na-ebi nʼọhịa nta ahụ na-enwu ọkụ.Ka ihe ndị a niile dịrị nʼisi Josef,nʼiku anya onye bụ nwa eze, nʼetiti ụmụnna ya. 17 Nʼịma mma, ọ dị ka nwa oke ehi e bụ ụzọ mụọ,mpi ya dị ka mpi ehi ọhịa.Ya ka ọ ga-eji sọda mba niileọ bụladị mba ndị ahụ dị na nsọtụ ụwa.Otu a ka iri puku kwụrụ puku ndị Ifrem dịotu a ka imerime puku ndị Manase dị.” 18 Banyere Zebụlọn, o kwuru sị,“Ṅụrịa, gị Zebụlọn, nʼọpụpụ gị,ma gị Isaka, ṅụrịa nʼebe obibi gị. 19 Ha ga-akpọ ndị mmadụ oku nʼelu ugwu ukwuu,nọ nʼebe ahụ chụọ aja ezi omume,ha ga-eri site nʼịba ụba nke ihe dị nʼosimiri,site nʼakụ nzuzo dị nʼaja.” 20 Banyere Gad, o kwuru sị,“Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-eme ka ebe obibi Gad saa mbara.Gad na-ebi dịka ọdụm,na-adọkapụ aka maọbụ isi. 21 Ọ họọrọ ala nke kachasị mma nye onwe ya;oke ruuru onyendu ka e wepụrụ dobere ya.Mgbe ndị ndu ndị mmadụ zukọrọ,o mezuru ezi ihe dị ONYENWE ANYỊ nʼobi,na ikpe ya niile banyere Izrel.” 22 Banyere Dan, o kwuru sị,“Dan bụ nwa ọdụm,onye na-esi na Bashan mapụta.” 23 Banyere Naftalị, o kwuru sị,“Naftalị bụ onye njupụta nke ihuọma ONYENWE ANYỊ dịrị,o jupụtakwara na ngọzị ya,ọ ga-eketa akụkụ ndịda nke iyi ukwu.” 24 Banyere Asha, o kwuru sị,“Onye a gọziri karịchasịa nʼụmụ ndị ikom ka Asha bụ,ka ihe banyere ya tọọ ụmụnna ya ụtọ,ka o jirikwa mmanụ saa ụkwụ ya. 25 Ihe mkpọchi nke ọnụ ụzọ ama gị ga-abụ bronz na igwe,dịka ụbọchị ndụ gị niile si dị, otu a ka ịdị ike gị ga-adị. 26 “O nweghị onye dịka Chineke Jeshurun,onye na-agba eluigwe dịka ịnyịnya ịbịa inyere gị aka,onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya nʼịdị ukwuu ya. 27 Chineke ebighị ebi bụ ebe mgbaba gị.Nʼokpuru gị ka aka ebighị ebi ya dị.Ọ ga-esite nʼihu gị chụpụ ndị iro gị, kwuokwa sị,‘Bibie ha!’ 28 Ya mere Izrel ga-ebi naanị ya nʼudo,isi iyi mmiri Jekọb dị chịm,nʼala ahụ jupụtara na mkpụrụ ubi na mmanya ọhụrụebe igirigi nke eluigwe na-ada. 29 Onye a gọziri agọzi ka ị bụ, gị Izrel,onye dị ka gịndị ONYENWE ANYỊ zọpụtara?Ọ bụ ọta gị na onye inyeaka gị,na mma agha gị dị ebube.Ndị iro gị ga-eji egwu daa nʼihu gị,ị ga-azọdakwa ebe ha niile dị elu.”
In Other Versions
Deuteronomy 33 in the ANGEFD
Deuteronomy 33 in the ANTPNG2D
Deuteronomy 33 in the AS21
Deuteronomy 33 in the BAGH
Deuteronomy 33 in the BBPNG
Deuteronomy 33 in the BBT1E
Deuteronomy 33 in the BDS
Deuteronomy 33 in the BEV
Deuteronomy 33 in the BHAD
Deuteronomy 33 in the BIB
Deuteronomy 33 in the BLPT
Deuteronomy 33 in the BNT
Deuteronomy 33 in the BNTABOOT
Deuteronomy 33 in the BNTLV
Deuteronomy 33 in the BOATCB
Deuteronomy 33 in the BOATCB2
Deuteronomy 33 in the BOBCV
Deuteronomy 33 in the BOCNT
Deuteronomy 33 in the BOECS
Deuteronomy 33 in the BOGWICC
Deuteronomy 33 in the BOHCB
Deuteronomy 33 in the BOHCV
Deuteronomy 33 in the BOHLNT
Deuteronomy 33 in the BOHNTLTAL
Deuteronomy 33 in the BOILNTAP
Deuteronomy 33 in the BOITCV
Deuteronomy 33 in the BOKCV
Deuteronomy 33 in the BOKCV2
Deuteronomy 33 in the BOKHWOG
Deuteronomy 33 in the BOKSSV
Deuteronomy 33 in the BOLCB
Deuteronomy 33 in the BOLCB2
Deuteronomy 33 in the BOMCV
Deuteronomy 33 in the BONAV
Deuteronomy 33 in the BONCB
Deuteronomy 33 in the BONLT
Deuteronomy 33 in the BONUT2
Deuteronomy 33 in the BOPLNT
Deuteronomy 33 in the BOSCB
Deuteronomy 33 in the BOSNC
Deuteronomy 33 in the BOTLNT
Deuteronomy 33 in the BOVCB
Deuteronomy 33 in the BOYCB
Deuteronomy 33 in the BPBB
Deuteronomy 33 in the BPH
Deuteronomy 33 in the BSB
Deuteronomy 33 in the CCB
Deuteronomy 33 in the CUV
Deuteronomy 33 in the CUVS
Deuteronomy 33 in the DBT
Deuteronomy 33 in the DGDNT
Deuteronomy 33 in the DHNT
Deuteronomy 33 in the DNT
Deuteronomy 33 in the ELBE
Deuteronomy 33 in the EMTV
Deuteronomy 33 in the ESV
Deuteronomy 33 in the FBV
Deuteronomy 33 in the FEB
Deuteronomy 33 in the GGMNT
Deuteronomy 33 in the GNT
Deuteronomy 33 in the HARY
Deuteronomy 33 in the HNT
Deuteronomy 33 in the IRVA
Deuteronomy 33 in the IRVB
Deuteronomy 33 in the IRVG
Deuteronomy 33 in the IRVH
Deuteronomy 33 in the IRVK
Deuteronomy 33 in the IRVM
Deuteronomy 33 in the IRVM2
Deuteronomy 33 in the IRVO
Deuteronomy 33 in the IRVP
Deuteronomy 33 in the IRVT
Deuteronomy 33 in the IRVT2
Deuteronomy 33 in the IRVU
Deuteronomy 33 in the ISVN
Deuteronomy 33 in the JSNT
Deuteronomy 33 in the KAPI
Deuteronomy 33 in the KBT1ETNIK
Deuteronomy 33 in the KBV
Deuteronomy 33 in the KJV
Deuteronomy 33 in the KNFD
Deuteronomy 33 in the LBA
Deuteronomy 33 in the LBLA
Deuteronomy 33 in the LNT
Deuteronomy 33 in the LSV
Deuteronomy 33 in the MAAL
Deuteronomy 33 in the MBV
Deuteronomy 33 in the MBV2
Deuteronomy 33 in the MHNT
Deuteronomy 33 in the MKNFD
Deuteronomy 33 in the MNG
Deuteronomy 33 in the MNT
Deuteronomy 33 in the MNT2
Deuteronomy 33 in the MRS1T
Deuteronomy 33 in the NAA
Deuteronomy 33 in the NASB
Deuteronomy 33 in the NBLA
Deuteronomy 33 in the NBS
Deuteronomy 33 in the NBVTP
Deuteronomy 33 in the NET2
Deuteronomy 33 in the NIV11
Deuteronomy 33 in the NNT
Deuteronomy 33 in the NNT2
Deuteronomy 33 in the NNT3
Deuteronomy 33 in the PDDPT
Deuteronomy 33 in the PFNT
Deuteronomy 33 in the RMNT
Deuteronomy 33 in the SBIAS
Deuteronomy 33 in the SBIBS
Deuteronomy 33 in the SBIBS2
Deuteronomy 33 in the SBICS
Deuteronomy 33 in the SBIDS
Deuteronomy 33 in the SBIGS
Deuteronomy 33 in the SBIHS
Deuteronomy 33 in the SBIIS
Deuteronomy 33 in the SBIIS2
Deuteronomy 33 in the SBIIS3
Deuteronomy 33 in the SBIKS
Deuteronomy 33 in the SBIKS2
Deuteronomy 33 in the SBIMS
Deuteronomy 33 in the SBIOS
Deuteronomy 33 in the SBIPS
Deuteronomy 33 in the SBISS
Deuteronomy 33 in the SBITS
Deuteronomy 33 in the SBITS2
Deuteronomy 33 in the SBITS3
Deuteronomy 33 in the SBITS4
Deuteronomy 33 in the SBIUS
Deuteronomy 33 in the SBIVS
Deuteronomy 33 in the SBT
Deuteronomy 33 in the SBT1E
Deuteronomy 33 in the SCHL
Deuteronomy 33 in the SNT
Deuteronomy 33 in the SUSU
Deuteronomy 33 in the SUSU2
Deuteronomy 33 in the SYNO
Deuteronomy 33 in the TBIAOTANT
Deuteronomy 33 in the TBT1E
Deuteronomy 33 in the TBT1E2
Deuteronomy 33 in the TFTIP
Deuteronomy 33 in the TFTU
Deuteronomy 33 in the TGNTATF3T
Deuteronomy 33 in the THAI
Deuteronomy 33 in the TNFD
Deuteronomy 33 in the TNT
Deuteronomy 33 in the TNTIK
Deuteronomy 33 in the TNTIL
Deuteronomy 33 in the TNTIN
Deuteronomy 33 in the TNTIP
Deuteronomy 33 in the TNTIZ
Deuteronomy 33 in the TOMA
Deuteronomy 33 in the TTENT
Deuteronomy 33 in the UBG
Deuteronomy 33 in the UGV
Deuteronomy 33 in the UGV2
Deuteronomy 33 in the UGV3
Deuteronomy 33 in the VBL
Deuteronomy 33 in the VDCC
Deuteronomy 33 in the YALU
Deuteronomy 33 in the YAPE
Deuteronomy 33 in the YBVTP
Deuteronomy 33 in the ZBP