Ephesians 5 (BOICB)
1 Ya mere bụrụnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ nʼanya. 2 Na-agakwanụ nʼime ịhụnanya, dịka Kraịst siri hụ anyị nʼanya ma were ndụ ya nye Chineke maka anyị dịka aja na onyinye nke isi ụtọ. 3 Ma nʼetiti unu, ka a ghara ịkpọta mmehie ịkwa iko, maọbụ nke adịghị ọcha, maọbụ nke inwe anya ukwu aha, nʼihi na ihe ndị a ekwesighị nʼetiti ndị nsọ. 4 Ọ dịkwaghị mma ka unu na-ekwu okwu rụrụ arụ maọbụ okwu nzuzu maọbụ njakịrị, kama ka e nwee inye ekele. 5 Matanụ nke ọma na onye na-akwa iko, maọbụ onye rụrụ arụ, maọbụ onye anya ukwu, nʼihi na anya ukwu dị ka ikpere arụsị, enweghị ike ịbata nʼalaeze Kraịst na Chineke. 6 Unu ekwela ka onye ọbụla jiri okwu efu duhie unu. Ọ bụ nʼihi omume ọjọọ ndị a ka iwe Chineke ji abịakwasị ndị na-anaghị erubere ya isi. 7 Unu na ndị dị otu a enwela mmekọ. 8 Nʼihi nʼoge gara aga, unu bụ ọchịchịrị, ma ugbu a, unu bụ ìhè nʼime Onyenwe anyị. Na-ebinụ ndụ ka ụmụ nke ìhè 9 (nʼihi na a na-ahụ mkpụrụ nke ìhè nʼihe niile dị mma, na ihe ziri ezi, na eziokwu). 10 Gbalịanụ ịchọpụta ihe na-amasị Onyenwe anyị. 11 Unu etinyela aka nʼọrụ ọchịchịrị nke na-adịghị amị mkpụrụ ọbụla, kama gbaanụ ha nʼanwụ. 12 Ọ bụ ihe ihere ikwu okwu banyere ihe ndị a na-eme na nzuzo. 13 Mgbe a gbara ihe ọbụla nʼanwụ, ọ na-apụta ìhè nke ọma. Nʼihi na ihe ọbụla e mere ka ọ pụta ìhè nke ọma bụ ìhè. 14 Nke a mere na e kwuru,“Bilie gị onye na-arahụ ụra.Site nʼọnwụ bilie.Kraịst ga-emekwa ka ihe ya mụkwasị gị.” 15 Kpachapụnụ anya otu unu si ebi ndụ unu. Unu ebila ndụ dị ka ndị nzuzu, kama bienụ ndụ dị ka ndị maara ihe. 16 Jirinụ ohere niile unu nwere rụọ ọrụ ọma, nʼihi na ụbọchị ndị a dị njọ. 17 Unu emela dị ka ndị na-enweghị uche, kama gbalịanụ ịchọpụta ihe Onyenwe anyị chọrọ ka unu mee, 18 Unu aṅụbigala mmanya oke nʼihi na ọ na-eduba na ndụ ịla nʼiyi. Kama jupụtanụ na Mmụọ Nsọ, 19 werenụ abụ ọma, na abụ nke ime mmụọ na-ekwe ukwe nʼetiti onwe unu. Werekwanụ obi unu niile na-abụrụ Onyenwe anyị abụ dị ụtọ. 20 Na-enyenụ Chineke bụ Nna ekele mgbe niile na nʼihe niile, nʼaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. 21 Na-edonụ onwe unu nʼokpuru ibe unu site nʼegwu Kraịst. 22 Unu ndị bụ nwunye, doonụ onwe unu nʼokpuru di unu dị ka unu si doo onwe unu nʼokpuru Onyenwe anyị. 23 Nʼihi na di bụ isi nwunye ya, dị ka Kraịst siri bụrụ isi nzukọ ya bụ chọọchị, na Onye nzọpụta ya nke bụ anụ ahụ ya. 24 Ya mere, dị ka nzukọ si edo onwe ya nʼokpuru Kraịst, otu a ka ndị bụ nwunye kwesiri ido onwe ha nʼokpuru di ha nʼihe niile. 25 Ndị bụ di, hụnụ nwunye unu nʼanya dị ka Kraịst siri hụ nzukọ ya bụ chọọchị nʼanya nwụọ nʼihi ya. 26 O mere nke a ka o nwee ike doo ya nsọ, jirikwa okwu ya na ịsa mmiri nke baptizim mee ka ọ dị ọcha. 27 Ka o chee nzukọ nʼihu ya onwe ya dị ka ihe jupụtara nʼebube, nke na-enweghị ntụpọ, maọbụ ihu mgbarụ ma ọ bụkwanụ ihe ọbụla dị otu a. Kama nke dị nsọ na-enweghị ịta ụta. 28 Nʼotu ụzọ ahụ kwa, ndị bụ di kwesiri ịhụ nwunye ha nʼanya dị ka ha si hụ anụ ahụ ha nʼanya. Nʼihi na onye ọbụla hụrụ nwunye ya nʼanya na-ahụ onwe ya nʼanya. 29 Ọ dịghị onye ọbụla nke kpọrọ anụ ahụ ya asị. Kama, ọ na-azụ ya na-edozikwa ya, dị ka Kraịst na-emere chọọchị. 30 Nʼihi na anyị niile bụ akụkụ anụ ahụ ya. 31 “Nʼihi nke a ka nwoke ga-eji hapụ nne na nna ya e jikọta ya na nwunye ya. Ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ.” 32 Nke a bụ ihe omimi dị ukwuu ma eji m ya atụnyere Kraịst na chọọchị ya. 33 Ma otu ọ dị, onye ọbụla nʼime unu aghaghị ịhụ nwunye ya nʼanya dị ka ọ hụrụ onwe ya, nwunye ọbụla aghakwaghị ịsọpụrụ di ya.
In Other Versions
Ephesians 5 in the ANGEFD
Ephesians 5 in the ANTPNG2D
Ephesians 5 in the AS21
Ephesians 5 in the BAGH
Ephesians 5 in the BBPNG
Ephesians 5 in the BBT1E
Ephesians 5 in the BDS
Ephesians 5 in the BEV
Ephesians 5 in the BHAD
Ephesians 5 in the BIB
Ephesians 5 in the BLPT
Ephesians 5 in the BNT
Ephesians 5 in the BNTABOOT
Ephesians 5 in the BNTLV
Ephesians 5 in the BOATCB
Ephesians 5 in the BOATCB2
Ephesians 5 in the BOBCV
Ephesians 5 in the BOCNT
Ephesians 5 in the BOECS
Ephesians 5 in the BOGWICC
Ephesians 5 in the BOHCB
Ephesians 5 in the BOHCV
Ephesians 5 in the BOHLNT
Ephesians 5 in the BOHNTLTAL
Ephesians 5 in the BOILNTAP
Ephesians 5 in the BOITCV
Ephesians 5 in the BOKCV
Ephesians 5 in the BOKCV2
Ephesians 5 in the BOKHWOG
Ephesians 5 in the BOKSSV
Ephesians 5 in the BOLCB
Ephesians 5 in the BOLCB2
Ephesians 5 in the BOMCV
Ephesians 5 in the BONAV
Ephesians 5 in the BONCB
Ephesians 5 in the BONLT
Ephesians 5 in the BONUT2
Ephesians 5 in the BOPLNT
Ephesians 5 in the BOSCB
Ephesians 5 in the BOSNC
Ephesians 5 in the BOTLNT
Ephesians 5 in the BOVCB
Ephesians 5 in the BOYCB
Ephesians 5 in the BPBB
Ephesians 5 in the BPH
Ephesians 5 in the BSB
Ephesians 5 in the CCB
Ephesians 5 in the CUV
Ephesians 5 in the CUVS
Ephesians 5 in the DBT
Ephesians 5 in the DGDNT
Ephesians 5 in the DHNT
Ephesians 5 in the DNT
Ephesians 5 in the ELBE
Ephesians 5 in the EMTV
Ephesians 5 in the ESV
Ephesians 5 in the FBV
Ephesians 5 in the FEB
Ephesians 5 in the GGMNT
Ephesians 5 in the GNT
Ephesians 5 in the HARY
Ephesians 5 in the HNT
Ephesians 5 in the IRVA
Ephesians 5 in the IRVB
Ephesians 5 in the IRVG
Ephesians 5 in the IRVH
Ephesians 5 in the IRVK
Ephesians 5 in the IRVM
Ephesians 5 in the IRVM2
Ephesians 5 in the IRVO
Ephesians 5 in the IRVP
Ephesians 5 in the IRVT
Ephesians 5 in the IRVT2
Ephesians 5 in the IRVU
Ephesians 5 in the ISVN
Ephesians 5 in the JSNT
Ephesians 5 in the KAPI
Ephesians 5 in the KBT1ETNIK
Ephesians 5 in the KBV
Ephesians 5 in the KJV
Ephesians 5 in the KNFD
Ephesians 5 in the LBA
Ephesians 5 in the LBLA
Ephesians 5 in the LNT
Ephesians 5 in the LSV
Ephesians 5 in the MAAL
Ephesians 5 in the MBV
Ephesians 5 in the MBV2
Ephesians 5 in the MHNT
Ephesians 5 in the MKNFD
Ephesians 5 in the MNG
Ephesians 5 in the MNT
Ephesians 5 in the MNT2
Ephesians 5 in the MRS1T
Ephesians 5 in the NAA
Ephesians 5 in the NASB
Ephesians 5 in the NBLA
Ephesians 5 in the NBS
Ephesians 5 in the NBVTP
Ephesians 5 in the NET2
Ephesians 5 in the NIV11
Ephesians 5 in the NNT
Ephesians 5 in the NNT2
Ephesians 5 in the NNT3
Ephesians 5 in the PDDPT
Ephesians 5 in the PFNT
Ephesians 5 in the RMNT
Ephesians 5 in the SBIAS
Ephesians 5 in the SBIBS
Ephesians 5 in the SBIBS2
Ephesians 5 in the SBICS
Ephesians 5 in the SBIDS
Ephesians 5 in the SBIGS
Ephesians 5 in the SBIHS
Ephesians 5 in the SBIIS
Ephesians 5 in the SBIIS2
Ephesians 5 in the SBIIS3
Ephesians 5 in the SBIKS
Ephesians 5 in the SBIKS2
Ephesians 5 in the SBIMS
Ephesians 5 in the SBIOS
Ephesians 5 in the SBIPS
Ephesians 5 in the SBISS
Ephesians 5 in the SBITS
Ephesians 5 in the SBITS2
Ephesians 5 in the SBITS3
Ephesians 5 in the SBITS4
Ephesians 5 in the SBIUS
Ephesians 5 in the SBIVS
Ephesians 5 in the SBT
Ephesians 5 in the SBT1E
Ephesians 5 in the SCHL
Ephesians 5 in the SNT
Ephesians 5 in the SUSU
Ephesians 5 in the SUSU2
Ephesians 5 in the SYNO
Ephesians 5 in the TBIAOTANT
Ephesians 5 in the TBT1E
Ephesians 5 in the TBT1E2
Ephesians 5 in the TFTIP
Ephesians 5 in the TFTU
Ephesians 5 in the TGNTATF3T
Ephesians 5 in the THAI
Ephesians 5 in the TNFD
Ephesians 5 in the TNT
Ephesians 5 in the TNTIK
Ephesians 5 in the TNTIL
Ephesians 5 in the TNTIN
Ephesians 5 in the TNTIP
Ephesians 5 in the TNTIZ
Ephesians 5 in the TOMA
Ephesians 5 in the TTENT
Ephesians 5 in the UBG
Ephesians 5 in the UGV
Ephesians 5 in the UGV2
Ephesians 5 in the UGV3
Ephesians 5 in the VBL
Ephesians 5 in the VDCC
Ephesians 5 in the YALU
Ephesians 5 in the YAPE
Ephesians 5 in the YBVTP
Ephesians 5 in the ZBP