Isaiah 60 (BOICB)
1 “Bilie, mụkee, nʼihi na ìhè gị abịala,ebube ONYENWE ANYỊ awaakwala nʼahụ gị dịka anyanwụ. 2 Lee, ọchịchịrị na-ekpuchi ụwa niile,oke ọchịchịrị na-ekpuchi ndị niile bi nʼụwa,ma ONYENWE ANYỊ ga-awa dịka anyanwụ nʼahụ gịebube ya ga-achakwa ka ihe nʼebe i nọ. 3 Mba niile dị iche iche ga-abịakwute ìhè gị,ndị eze niile ga-abịaru mmụke nke ọwụwa gị. 4 “Welienụ anya unu abụọ elu legharịa gburugburu unu,ha niile na-ezukọta na-abịakwute gị;ụmụ gị ndị ikom na-esi nʼebe dị anya bịa,ụmụ gị ndị inyom ka a ga-ekukwa nʼụkwụ. 5 Mgbe ahụ, ị ga-elepụ anya ma chakee,obi gị ga-atọ gị ụtọ, saa mbara nʼihi ọṅụ,nʼihi na akụ niile nke osimiri ka a ga-ewebatara gị,akụnụba nke ọtụtụ mba ga-abịara gị. 6 Ọtụtụ igwe ịnyịnya kamel nke si Midiana Efaa ga-ejupụta nʼala gị,ma ndị sikwa nʼobodo Shebaga-ebutere gị ọlaedo na ụda na-esi isi ụtọ.Ha ga-ekwusakwa otuto Onyenwe anyị. 7 A ga-enye gị igwe ewu na atụrụ niile nke ndị Keda.Ebule niile nke Nebaiot ga-abụ nke gị.A ga-anabata ha dịka onyinye nʼelu ebe ịchụ aja m.Aga m edozi ụlọnsọ m dị ebube, mee ya ka ọ maa mma karịa. 8 “Olee ndị bụ ndị a na-efegharị dịka igwe ojii,ndị na-efegharị dịka ụmụ nduru na-efeba nʼakwụ ha? 9 Nʼezie, mụ ka ala ndị ahụ mmiri gbara gburugburu na-echere;ụgbọ niile nke Tashish ga-ebukwa ụzọ,na-ebughachi ụmụ gị site nʼebe dị anya,ha na ọlaọcha na ọlaedo ha niile.Inye ONYENWE ANYỊ bụ Chineke gị nsọpụrụ,Onye nsọ nke Izrel,nʼihi na ọ jirila ịma mma gọzie gị. 10 “Ndị mba ọzọ ga-abịa wuziere unu mgbidi unu niile.Ndị na-achị achị na ndị eze ha niile ga-ejere unu ozi.Ọ bụ ezie na m tikpọrọ gị nʼiwe m,ma site nʼamara m, aga m emere gị ebere. 11 Ọnụ ụzọ ama gị ga-eghe oghe oge niilesite nʼụtụtụ ruo nʼụtụtụ,ịnabata akụ niile si na mba dị iche iche.A ga-edurukwa ndị eze dị iche iche bata nʼime ya nʼọnọdụ ndị a dọtara nʼagha. 12 Mba ọbụla jụrụ ijere gị ozi ga-ala nʼiyi;a ga-ekpochapụ ha. 13 “Otuto niile na ịma mma niile nke Lebanọn ga-abụ nke gị.Osisi junipa, na osisi fịa, na osisi junipa, na osisi saipres,ka a ga-eji chọọ ụlọnsọ m mma.Aga m emekwa ka ebube jupụta nʼebe ahụ ụkwụ m na-adị mgbe niile. 14 Ụmụ ndị na-emegbu gị ga-abịa kpọọ isiala nye gị.Ndị ahụ niile na-elelị gị ga-abịa daa nʼala nʼihu gị sutu ụkwụ gị ọnụ.Ha ga-akpọ Jerusalem, Obodo ONYENWE ANYỊ,Zayọn nke Onye nsọ Izrel. 15 “Ọ bụ ezie na ọ dị mgbe ị bụ onye a kpọrọ asị, onye a na-emegbu,onye mmadụ niile na-eweda nʼala,ma ugbu a, ị ga-ama mma ruo ebighị ebi;ị ga-abụ ihe na-ewetara ọgbọ niile nke ụwa ọṅụ, nʼihi na otu a ka m ga-eme gị. 16 Ị ga-aṅụ mmiri ara nke mba dị iche iche,ọ bụkwa ara ndị eze ka a ga-eji zuo gị.Mgbe ahụ, ị ga-amata nʼezie na mụ onwe m, bụ ONYENWE ANYỊ bụ Onye nzọpụta gịna Onye mgbapụta gị, Onye dị ike nke Jekọb. 17 Nʼọnọdụ bronz, aga m eweta ọlaedo,nʼọnọdụ igwe aga m eweta ọlaọcha.Nʼọnọdụ osisi, ọ ga-abụ ọla,nʼọnọdụ nkume, ọ ga-abụ igwe.M ga-eme ka udo bụrụ ndị nlekọta gịezi omume ga-abụ onye na-achị gị. 18 Ihe ike agaghị adịkwa nʼala gị ọzọ.Agha niile ga-akwụsị, mbibi na ịla nʼiyi agaghị adịkwa.Mgbidi gị ga-aghọ Nzọpụta,ị ga-akpọkwa ọnụ ụzọ ama gị niile Otuto. 19 Anyanwụ agaghị abụkwara gị ìhè nʼehihie ọzọ,maọbụ maramara nke ọnwa amụkwasị gị ihe,nʼihi na ONYENWE ANYỊ Chineke gị ga-abụrụ gị ìhè ruo ebighị ebi,Chineke gị ga-abụkwa ebube gị. 20 Anwụ gị agaghị ada ada,ọnwa gị agaghị akwụsịkwa ịcha;nʼihi na ONYENWE ANYỊ ga-abụrụ gị ìhè ụbọchị gị niile,iru ụjụ gị niile ga-agabigakwa. 21 Mgbe ahụ, ndị gị niile ga-abụ ndị ezi omume,ha ga-enwetakwa ala ahụ ruo ebighị ebi.Ha bụ ome nke m kụrụ,bụ ọrụ aka m,ime ka ịma mma m pụta ìhè. 22 Ezinaụlọ dị nta ga-aba ụba ghọọ obodo,mba nta ga-aghọ obodo buru ibu.Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYỊ,ga-eme ka ha niile mezuo ọsịịsọ nʼoge ya.”
In Other Versions
Isaiah 60 in the ANGEFD
Isaiah 60 in the ANTPNG2D
Isaiah 60 in the AS21
Isaiah 60 in the BAGH
Isaiah 60 in the BBPNG
Isaiah 60 in the BBT1E
Isaiah 60 in the BDS
Isaiah 60 in the BEV
Isaiah 60 in the BHAD
Isaiah 60 in the BIB
Isaiah 60 in the BLPT
Isaiah 60 in the BNT
Isaiah 60 in the BNTABOOT
Isaiah 60 in the BNTLV
Isaiah 60 in the BOATCB
Isaiah 60 in the BOATCB2
Isaiah 60 in the BOBCV
Isaiah 60 in the BOCNT
Isaiah 60 in the BOECS
Isaiah 60 in the BOGWICC
Isaiah 60 in the BOHCB
Isaiah 60 in the BOHCV
Isaiah 60 in the BOHLNT
Isaiah 60 in the BOHNTLTAL
Isaiah 60 in the BOILNTAP
Isaiah 60 in the BOITCV
Isaiah 60 in the BOKCV
Isaiah 60 in the BOKCV2
Isaiah 60 in the BOKHWOG
Isaiah 60 in the BOKSSV
Isaiah 60 in the BOLCB
Isaiah 60 in the BOLCB2
Isaiah 60 in the BOMCV
Isaiah 60 in the BONAV
Isaiah 60 in the BONCB
Isaiah 60 in the BONLT
Isaiah 60 in the BONUT2
Isaiah 60 in the BOPLNT
Isaiah 60 in the BOSCB
Isaiah 60 in the BOSNC
Isaiah 60 in the BOTLNT
Isaiah 60 in the BOVCB
Isaiah 60 in the BOYCB
Isaiah 60 in the BPBB
Isaiah 60 in the BPH
Isaiah 60 in the BSB
Isaiah 60 in the CCB
Isaiah 60 in the CUV
Isaiah 60 in the CUVS
Isaiah 60 in the DBT
Isaiah 60 in the DGDNT
Isaiah 60 in the DHNT
Isaiah 60 in the DNT
Isaiah 60 in the ELBE
Isaiah 60 in the EMTV
Isaiah 60 in the ESV
Isaiah 60 in the FBV
Isaiah 60 in the FEB
Isaiah 60 in the GGMNT
Isaiah 60 in the GNT
Isaiah 60 in the HARY
Isaiah 60 in the HNT
Isaiah 60 in the IRVA
Isaiah 60 in the IRVB
Isaiah 60 in the IRVG
Isaiah 60 in the IRVH
Isaiah 60 in the IRVK
Isaiah 60 in the IRVM
Isaiah 60 in the IRVM2
Isaiah 60 in the IRVO
Isaiah 60 in the IRVP
Isaiah 60 in the IRVT
Isaiah 60 in the IRVT2
Isaiah 60 in the IRVU
Isaiah 60 in the ISVN
Isaiah 60 in the JSNT
Isaiah 60 in the KAPI
Isaiah 60 in the KBT1ETNIK
Isaiah 60 in the KBV
Isaiah 60 in the KJV
Isaiah 60 in the KNFD
Isaiah 60 in the LBA
Isaiah 60 in the LBLA
Isaiah 60 in the LNT
Isaiah 60 in the LSV
Isaiah 60 in the MAAL
Isaiah 60 in the MBV
Isaiah 60 in the MBV2
Isaiah 60 in the MHNT
Isaiah 60 in the MKNFD
Isaiah 60 in the MNG
Isaiah 60 in the MNT
Isaiah 60 in the MNT2
Isaiah 60 in the MRS1T
Isaiah 60 in the NAA
Isaiah 60 in the NASB
Isaiah 60 in the NBLA
Isaiah 60 in the NBS
Isaiah 60 in the NBVTP
Isaiah 60 in the NET2
Isaiah 60 in the NIV11
Isaiah 60 in the NNT
Isaiah 60 in the NNT2
Isaiah 60 in the NNT3
Isaiah 60 in the PDDPT
Isaiah 60 in the PFNT
Isaiah 60 in the RMNT
Isaiah 60 in the SBIAS
Isaiah 60 in the SBIBS
Isaiah 60 in the SBIBS2
Isaiah 60 in the SBICS
Isaiah 60 in the SBIDS
Isaiah 60 in the SBIGS
Isaiah 60 in the SBIHS
Isaiah 60 in the SBIIS
Isaiah 60 in the SBIIS2
Isaiah 60 in the SBIIS3
Isaiah 60 in the SBIKS
Isaiah 60 in the SBIKS2
Isaiah 60 in the SBIMS
Isaiah 60 in the SBIOS
Isaiah 60 in the SBIPS
Isaiah 60 in the SBISS
Isaiah 60 in the SBITS
Isaiah 60 in the SBITS2
Isaiah 60 in the SBITS3
Isaiah 60 in the SBITS4
Isaiah 60 in the SBIUS
Isaiah 60 in the SBIVS
Isaiah 60 in the SBT
Isaiah 60 in the SBT1E
Isaiah 60 in the SCHL
Isaiah 60 in the SNT
Isaiah 60 in the SUSU
Isaiah 60 in the SUSU2
Isaiah 60 in the SYNO
Isaiah 60 in the TBIAOTANT
Isaiah 60 in the TBT1E
Isaiah 60 in the TBT1E2
Isaiah 60 in the TFTIP
Isaiah 60 in the TFTU
Isaiah 60 in the TGNTATF3T
Isaiah 60 in the THAI
Isaiah 60 in the TNFD
Isaiah 60 in the TNT
Isaiah 60 in the TNTIK
Isaiah 60 in the TNTIL
Isaiah 60 in the TNTIN
Isaiah 60 in the TNTIP
Isaiah 60 in the TNTIZ
Isaiah 60 in the TOMA
Isaiah 60 in the TTENT
Isaiah 60 in the UBG
Isaiah 60 in the UGV
Isaiah 60 in the UGV2
Isaiah 60 in the UGV3
Isaiah 60 in the VBL
Isaiah 60 in the VDCC
Isaiah 60 in the YALU
Isaiah 60 in the YAPE
Isaiah 60 in the YBVTP
Isaiah 60 in the ZBP