Zephaniah 3 (BOICB)
1 Ahụhụ dịrị obodo ahụ ndị mmegbu,na ndị na-enupu isi, na ndị rụrụ arụ jupụtara nʼime ya. 2 Ọ naghị ege onye ọbụla ntị,ọ dịghị anabata ịdọ aka na ntị.Ọ dịghị atụkwasị ONYENWE ANYỊ obi,ọ dịkwaghị abịakwute Chineke ya nso. 3 Ndịisi nọ nʼetiti yadịka ọdụm na-agbọ ụja,ndị ọkaikpe ya dịka nkịta ọhịa na-achụ nta anyasị,nke ihe ọ chụtara na nta adịghị anọ tutu chi abọọ. 4 Ndị amụma ya bụ ndị ndu rụrụ arụ,ha bụkwa ndị aghụghọ.Ndị nchụaja ya na-emerụ ebe nsọna-ejikwa ike emebi iwu. 5 Ma ONYENWE ANYỊ, onye nọ nʼetiti ya bụ onye ezi omume.Ọ nakwaghị eme ihe ọjọọ.Ụtụtụ niile ka ọ na-eme ka ikpe ziri ezi ya pụta ìhè;ụbọchị ọbụla ọ naghị ahapụ igosi ya,ma ndị ajọ omume enweghị ihere. 6 “Egbuchapụla m mba niile dị iche iche,kwatukwaa ebe ha niile e wusiri ike.Ahapụla m okporoụzọ ha ka ọ bụrụ ihe a gbahapụrụ agbahapụ,ọ dịkwaghị onye na-esi na ha agabiga.A laala obodo ha niile nʼiyi,ọ dịkwaghị onye fọdụrụ, ọ bụladị otu onye. 7 Asịrị m, banyere Jerusalem,‘Nʼezie, ị ga-atụ egwu m,ma nabatakwa ntụziaka.’Mgbe ahụ, agaghị ebibi ebe mgbaba ya,ma ọ bụkwanụ ntaramahụhụ m niile agaghị abịakwasịkwa ya.Ma otu ọ dị, ọ nụrụ ha ọkụ nʼobi ịga nʼihumee omume rụrụ arụ nʼihe niile bụ nke ha mere. 8 Nʼihi nke a, cherenụ m,” otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri,“nʼụbọchị ahụ m ga-ebili ịgba akaebe.Mkpebi m bụ ịchịkọta mba niile dị iche iche,na ịkpọkọta alaeze niile,ịwụkwasị ha oke iwe m,ọ bụladị ọnụma niile nke iwe m.Ọkụ, nke iwe si nʼekworo m,ka a ga-eji rechapụ ụwa niile. 9 “Mgbe ahụ, aga m anụcha egbugbere ọnụ ndị niile dị iche iche mee ka ọ bụrụ ihe dị ọcha,ka ha niile nwee ike ịkpọku aha ONYENWE ANYỊ,ma jikọta aka fekwaa ya ofufe. 10 Site nʼofe osimiri niile nke Kush,bụ ndị m a chụsasịrị achụsasị, ndị na-akpọ isiala nye m,ga-ewetara m onyinye dị iche iche. 11 Nʼụbọchị ahụ, gị bụ Jerusalem, agaghị eme ka ihere mee gị,nʼihi omume njehie niile i jere megide m,nʼihi na aga m esite nʼetiti gị wezuga ndị gị niilena-aṅụrị ọṅụ na mpako ha.A gaghị ahụkwa ndị na-afụli onwe ha elunʼugwu nsọ m. 12 Ma aga m eme ka ndị dị nwayọọ nʼobi,na ndị dị umeala nʼobifọdụ nʼetiti ndị Izrel,ha ga-agbabakwa nʼaha ONYENWE ANYỊ. 13 Ha agaghị emekwa ihe ọjọọ,ha agaghị ekwu okwu ụgha.Ire na-ekwu okwu aghụghọagaghị adịkwa nʼọnụ ha.Ha ga-akpa nri ma dinakwa ala,ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ha tụọ egwu.” 14 Bụọ abụ, gị nwaada Zayọn;tie mkpu, gị Izrel.Ṅụrịa ọṅụ, e, jiri obi gị niile ṅụrịa ọṅụ,gị nwaada Jerusalem. 15 Nʼihi na ONYENWE ANYỊ ewezugala ahụhụ dịrị gị,chụghachikwa ndị iro gị azụ. ONYENWE ANYỊ, onye bụ Eze Izrel, nọ nʼetiti gị.Ị gaghị atụkwa egwu ihe ọjọọ ọzọ. 16 Nʼụbọchị ahụ,ihe a ga-agwa Jerusalem ga-abụ,“Atụla egwu, gị Zayọn,ekwela ka aka gị daa mba. 17 ONYENWE ANYỊ bụ Chineke gị nọ nʼetiti gị,ọ bụ Dike nʼagha nke na-enye mmeri.Ọ ga-eji ọṅụ nwee mmasị na ahụ gị;nʼihi ịhụnanya ya, ọ gaghị abakwara gị mba,kama ọ ga-eji oke iti mkpu abụ ṅụrịa ọṅụ nʼebe ị nọ.” 18 “Nʼụbọchị mmemme a kara aka,aga m ewepụrụ gị ọdachi iru ụjụ,nke bụ ibu arụ na ihe ịta ụta dịrị gị. 19 Nʼoge ahụ,aga m emesi ndị ahụ niile na-emegbu gị ike.Aga m azọpụta ndị ụkwụ rụrụ,chịkọtakwa ndị niile e mere ka ha gaa biri nʼala ndị ọzọ.Aga m agbanwe ihere ha ka ọ bụrụ ihe otutonʼihe na-ewu ewu nʼụwa ebe ha natara ihere. 20 Nʼoge ahụ, aga m akpọlata unu nʼụlọ;mgbe m ga-akpọkọta unu ọnụ.Aga m eme ka unu na-ewu ewuka unu nwekwaa otuto nʼetiti mmadụ niile bi nʼụwa,mgbe m ga-eweghachi ihe ọma ununʼihu anya unu.”Ka ONYENWE ANYỊ kwuru.
In Other Versions
Zephaniah 3 in the ANGEFD
Zephaniah 3 in the ANTPNG2D
Zephaniah 3 in the AS21
Zephaniah 3 in the BAGH
Zephaniah 3 in the BBPNG
Zephaniah 3 in the BBT1E
Zephaniah 3 in the BDS
Zephaniah 3 in the BEV
Zephaniah 3 in the BHAD
Zephaniah 3 in the BIB
Zephaniah 3 in the BLPT
Zephaniah 3 in the BNT
Zephaniah 3 in the BNTABOOT
Zephaniah 3 in the BNTLV
Zephaniah 3 in the BOATCB
Zephaniah 3 in the BOATCB2
Zephaniah 3 in the BOBCV
Zephaniah 3 in the BOCNT
Zephaniah 3 in the BOECS
Zephaniah 3 in the BOGWICC
Zephaniah 3 in the BOHCB
Zephaniah 3 in the BOHCV
Zephaniah 3 in the BOHLNT
Zephaniah 3 in the BOHNTLTAL
Zephaniah 3 in the BOILNTAP
Zephaniah 3 in the BOITCV
Zephaniah 3 in the BOKCV
Zephaniah 3 in the BOKCV2
Zephaniah 3 in the BOKHWOG
Zephaniah 3 in the BOKSSV
Zephaniah 3 in the BOLCB
Zephaniah 3 in the BOLCB2
Zephaniah 3 in the BOMCV
Zephaniah 3 in the BONAV
Zephaniah 3 in the BONCB
Zephaniah 3 in the BONLT
Zephaniah 3 in the BONUT2
Zephaniah 3 in the BOPLNT
Zephaniah 3 in the BOSCB
Zephaniah 3 in the BOSNC
Zephaniah 3 in the BOTLNT
Zephaniah 3 in the BOVCB
Zephaniah 3 in the BOYCB
Zephaniah 3 in the BPBB
Zephaniah 3 in the BPH
Zephaniah 3 in the BSB
Zephaniah 3 in the CCB
Zephaniah 3 in the CUV
Zephaniah 3 in the CUVS
Zephaniah 3 in the DBT
Zephaniah 3 in the DGDNT
Zephaniah 3 in the DHNT
Zephaniah 3 in the DNT
Zephaniah 3 in the ELBE
Zephaniah 3 in the EMTV
Zephaniah 3 in the ESV
Zephaniah 3 in the FBV
Zephaniah 3 in the FEB
Zephaniah 3 in the GGMNT
Zephaniah 3 in the GNT
Zephaniah 3 in the HARY
Zephaniah 3 in the HNT
Zephaniah 3 in the IRVA
Zephaniah 3 in the IRVB
Zephaniah 3 in the IRVG
Zephaniah 3 in the IRVH
Zephaniah 3 in the IRVK
Zephaniah 3 in the IRVM
Zephaniah 3 in the IRVM2
Zephaniah 3 in the IRVO
Zephaniah 3 in the IRVP
Zephaniah 3 in the IRVT
Zephaniah 3 in the IRVT2
Zephaniah 3 in the IRVU
Zephaniah 3 in the ISVN
Zephaniah 3 in the JSNT
Zephaniah 3 in the KAPI
Zephaniah 3 in the KBT1ETNIK
Zephaniah 3 in the KBV
Zephaniah 3 in the KJV
Zephaniah 3 in the KNFD
Zephaniah 3 in the LBA
Zephaniah 3 in the LBLA
Zephaniah 3 in the LNT
Zephaniah 3 in the LSV
Zephaniah 3 in the MAAL
Zephaniah 3 in the MBV
Zephaniah 3 in the MBV2
Zephaniah 3 in the MHNT
Zephaniah 3 in the MKNFD
Zephaniah 3 in the MNG
Zephaniah 3 in the MNT
Zephaniah 3 in the MNT2
Zephaniah 3 in the MRS1T
Zephaniah 3 in the NAA
Zephaniah 3 in the NASB
Zephaniah 3 in the NBLA
Zephaniah 3 in the NBS
Zephaniah 3 in the NBVTP
Zephaniah 3 in the NET2
Zephaniah 3 in the NIV11
Zephaniah 3 in the NNT
Zephaniah 3 in the NNT2
Zephaniah 3 in the NNT3
Zephaniah 3 in the PDDPT
Zephaniah 3 in the PFNT
Zephaniah 3 in the RMNT
Zephaniah 3 in the SBIAS
Zephaniah 3 in the SBIBS
Zephaniah 3 in the SBIBS2
Zephaniah 3 in the SBICS
Zephaniah 3 in the SBIDS
Zephaniah 3 in the SBIGS
Zephaniah 3 in the SBIHS
Zephaniah 3 in the SBIIS
Zephaniah 3 in the SBIIS2
Zephaniah 3 in the SBIIS3
Zephaniah 3 in the SBIKS
Zephaniah 3 in the SBIKS2
Zephaniah 3 in the SBIMS
Zephaniah 3 in the SBIOS
Zephaniah 3 in the SBIPS
Zephaniah 3 in the SBISS
Zephaniah 3 in the SBITS
Zephaniah 3 in the SBITS2
Zephaniah 3 in the SBITS3
Zephaniah 3 in the SBITS4
Zephaniah 3 in the SBIUS
Zephaniah 3 in the SBIVS
Zephaniah 3 in the SBT
Zephaniah 3 in the SBT1E
Zephaniah 3 in the SCHL
Zephaniah 3 in the SNT
Zephaniah 3 in the SUSU
Zephaniah 3 in the SUSU2
Zephaniah 3 in the SYNO
Zephaniah 3 in the TBIAOTANT
Zephaniah 3 in the TBT1E
Zephaniah 3 in the TBT1E2
Zephaniah 3 in the TFTIP
Zephaniah 3 in the TFTU
Zephaniah 3 in the TGNTATF3T
Zephaniah 3 in the THAI
Zephaniah 3 in the TNFD
Zephaniah 3 in the TNT
Zephaniah 3 in the TNTIK
Zephaniah 3 in the TNTIL
Zephaniah 3 in the TNTIN
Zephaniah 3 in the TNTIP
Zephaniah 3 in the TNTIZ
Zephaniah 3 in the TOMA
Zephaniah 3 in the TTENT
Zephaniah 3 in the UBG
Zephaniah 3 in the UGV
Zephaniah 3 in the UGV2
Zephaniah 3 in the UGV3
Zephaniah 3 in the VBL
Zephaniah 3 in the VDCC
Zephaniah 3 in the YALU
Zephaniah 3 in the YAPE
Zephaniah 3 in the YBVTP
Zephaniah 3 in the ZBP