Isaiah 66 (BOICB)

1 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu,“Eluigwe bụ ocheeze m,ụwa bụkwa ebe mgbakwasị ụkwụ m.Ọ bụ ụdị ụlọ gịnị ka ị ga-ewuru m?Ebee ka ebe izuike m ga-adị?” 2 Ọ bụghị aka m mere ihe ndị a niile,mee ka ha ji dịrị?Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwupụtara. “Ma olee ndị ihe ha na-atọ m ụtọ,ọ bụ ndị ahụ nwere obi umeala, ndị na-adịghị ebuli onwe ha elu,ndị na-amakwa jijiji nʼokwu m. 3 Ma onye ọbụla nke na-achụ aja ehidịka nwoke na-egbu mmadụ,onye ọbụla jikwa nwa atụrụ achụ ajadị ka onye na-agbaji nkịta olu,onye ọbụla na-achụ aja mkpụrụ ọkadị ka onye na-eche ọbara ezi,otu a kwa, onye ọbụla na-esure ụda na-esi isi ụtọ nke nchetadị ka onye na-efe arụsị.Ha ahọpụtarala onwe ha ụzọ nke ha,ha na-enwekwa mmasị nʼihe arụ ha niile. 4 Ya mere, aga m ezitere ha ahụhụ dị egwu,mee ka ihe ahụ ha na-atụ egwu ya bịakwasị ha.Nʼihi na mgbe m kpọrọ ha oku, ha azaghị,mgbe m gwara ha okwu, ha egeghị ntị.Kama ha mere ihe ọjọọ nʼihu m,họrọkwa ime ihe ndị ahụ ha maara na m kpọrọ asị.” 5 Nụrụnụ okwu ONYENWE ANYỊ,unu ndị na-ama jijiji nʼokwu ya,“Ụmụnna unu, ndị kpọrọ unu asị,ndị chụpụkwara unu nʼihi aha m, ekwuola sị,‘Ka a sọpụrụ Onyenwe anyị!Ka anyị lee ụdị ọṅụ ga-abụ nke unu!’Ma a ga-etinye ha nʼọnọdụ ihere. 6 Ọ bụ gịnị bụ mkpọtụ dị nʼime obodo?Gịnị bụ oke ụzụ na-ada nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị?Ọ bụ ụzụ ONYENWE ANYỊ na-eme.Onye ahụ na-akwụghachi ndị iro ya ụgwọ ruuru ha. 7 “Tupu ime amalite ime ya,ọ mụpụtalarị nwa ya.Tupu ihe mgbu ya ebido,ọ mụpụtala nwa nwoke. 8 Onye jiri ntị ya nụtụ ihe dị otu a mbụ?Onye kwa ji anya ya hụ ihe dị otu a?A pụrụ ịmụpụta otu mba nʼotu ụbọchị?Ka e nwere ike ime ka otu obodo malite ịdị nʼotu ntabi anya?Lee na tupu ihe mgbu nke ọmụmụ nwa ya ebidoZayọn amụpụtala ụmụ ya. 9 Mụ onwe m, m ga-eme ka nwa rute nʼoge ọmụmụgharakwa ime ka a mụọ ya?”ka ONYENWE ANYỊ na-ekwu.“M ga-emechi akpanwamgbe m na-eme ka a mụpụta ya?”ka Chineke gị jụrụ. 10 “Soronụ Jerusalem ṅụrịa ọṅụ, soronụ ya nwee obi ụtọ,unu ndị niile hụrụ ya nʼanya;soronụ ya ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu,unu ndị ruru ụjụ nʼihi ya. 11 Nʼihi na ihe banyere Jerusalem ga-atọ unu ụtọ.Unu ga-aṅụjukwa ara nkasiobi ya afọ,ọ bụladị dịka nwantakịrị si enwe obi ụtọmgbe ọ na-aṅụ ara nne ya nke na-agba nke ọma.” 12 Nʼihi na ihe ndị a ka ONYENWE ANYỊ kwuru,“Aga m eme ka udo bara ya ụba dịka osimiri,mee ka akụnụba niile nke ndị mba ọzọ dịrị ka mmiri na-asọbiga oke.Ọ ga-elekọta gị, kurukwa gị, makụọkwa gị nʼaka ya,wugharịakwa gị nʼikpere ya. 13 Dịka nne si akasị nwa ya obi,otu a ka m ga-esi kasịe unu obi.Ọ bụ nʼime Jerusalem ka a ga-akasị unu obi.” 14 Mgbe ị hụrụ ihe ndị a, obi gị ga-aṅụrị ọṅụ,ịga awasa dịka ahịhịa ọhụrụ;a ga-emekwa ka aka ONYENWE ANYỊ pụta ìhè nʼebe ndị ohu ya nọ,ma a ga-egosi ndị iro ya oke iwe ya. 15 Nʼihi na lee, ONYENWE ANYỊ ga-eji ọkụ bịa.Ụgbọala ya ga-adịkwa ka oke ifufe.Ọ ga-eji ọnụma gosi iwe ya,werekwa ọkụ na-enwu enwu baa mba. 16 Nʼihi na ONYENWE ANYỊ ga-eji ọkụ na mma agha yakpee ndị mmadụ niile ikpe.Ọ ga-egbukwa ọtụtụ mmadụ. 17 “Ndị ahụ niile na-edo onwe ha nsọ, ndị na-eme onwe ha ka ha dị ọcha nʼihi ịbanye nʼubi a gbara ogige, ndị ahụ na-eso onye ahụ nọ nʼetiti ndị ahụ na-eri anụ ezi, na oke, na ihe ndị ọzọ ahụ niile rụrụ arụ, ga-ezute ọnwụ nke nọ na-eche ha niile.” Otu a ka ONYENWE ANYỊ kwubiri ya. 18 “Ma mụ onwe m, amaara m nke ọma ihe ha zubere ma meekwa, ana m abịa ịchịkọta mba niile na-asụ asụsụ dị iche iche. Ha niile ga-abịakwa hụ ebube m. 19 “Aga m edokwa ihe ịrịbama nʼetiti ha, zipụkwa ndị fọdụrụ ndụ nʼetiti ha ka ha gaa nʼobodo Tashish, na Libiya, na Lidiya (ndị na-agba àkụ nʼụta nke ọma) na Tubal, na Griis. E, ha ga-eje na mba niile nke dị anya, nʼofe osimiri, ebe ndị bi nʼime ya na-anụbeghị ihe banyere ịdị ukwuu nke m, maọbụ hụ ebube m. Ha ga-ekwusakwa ihe banyere ebube m nʼetiti mba niile dị iche iche. 20 Ha ga-akpọghachi ụmụnne unu niile site na mba niile, bịa nʼugwu nsọ m dị na Jerusalem, dịka onyinye a na-ewetara ONYENWE ANYỊ. Ha ga-ebute ha nʼelu ịnyịnya, nʼụgbọ agha, nʼelu ụgbọala a na-adọkpụ adọkpụ, nʼelu ịnyịnya muul na nʼelu ịnyịnya kamel,” ka ONYENWE ANYỊ na-ekwu. “Ha ga-ebubata ha dịka mgbe ndị Izrel na-ewebata onyinye mkpụrụ ha nʼụlọnsọ ONYENWE ANYỊ nʼefere mmemme dị ọcha. 21 Aga m ahọrọkwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị nchụaja na ndị Livayị,” ka ONYENWE ANYỊ kwuru. 22 “Dịka eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ahụ nke m ga-eke ga-esi dịgide nʼihu m, otu a ka aha unu na agbụrụ unu ga-adịgide, ka ONYENWE ANYỊ kwubiri. 23 Ọ ga-abụkwa na site nʼotu Ọnwa ọhụrụ ruo nke ọzọ, sitekwa nʼotu ụbọchị izuike ruo na nke ọzọ ya, anụ ahụ niile bụ mmadụ ga-abịa, daa, kpọọ isiala nʼihu m,” ka ONYENWE ANYỊ kwuru. 24 “Ha ga-apụ, jee, lekwasị ozu ndị ahụ niile nwụrụ anwụ anya, bụ ndị ahụ niile nupuru isi megide m. Nʼihi na ikpuru ha agaghị anwụ anwụ, ọkụ a kwanyere agakwaghị anyụ anyụ. Ha ga-abụkwara mmadụ niile ihe na-asọ oyi.”

In Other Versions

Isaiah 66 in the ANGEFD

Isaiah 66 in the ANTPNG2D

Isaiah 66 in the AS21

Isaiah 66 in the BAGH

Isaiah 66 in the BBPNG

Isaiah 66 in the BBT1E

Isaiah 66 in the BDS

Isaiah 66 in the BEV

Isaiah 66 in the BHAD

Isaiah 66 in the BIB

Isaiah 66 in the BLPT

Isaiah 66 in the BNT

Isaiah 66 in the BNTABOOT

Isaiah 66 in the BNTLV

Isaiah 66 in the BOATCB

Isaiah 66 in the BOATCB2

Isaiah 66 in the BOBCV

Isaiah 66 in the BOCNT

Isaiah 66 in the BOECS

Isaiah 66 in the BOGWICC

Isaiah 66 in the BOHCB

Isaiah 66 in the BOHCV

Isaiah 66 in the BOHLNT

Isaiah 66 in the BOHNTLTAL

Isaiah 66 in the BOILNTAP

Isaiah 66 in the BOITCV

Isaiah 66 in the BOKCV

Isaiah 66 in the BOKCV2

Isaiah 66 in the BOKHWOG

Isaiah 66 in the BOKSSV

Isaiah 66 in the BOLCB

Isaiah 66 in the BOLCB2

Isaiah 66 in the BOMCV

Isaiah 66 in the BONAV

Isaiah 66 in the BONCB

Isaiah 66 in the BONLT

Isaiah 66 in the BONUT2

Isaiah 66 in the BOPLNT

Isaiah 66 in the BOSCB

Isaiah 66 in the BOSNC

Isaiah 66 in the BOTLNT

Isaiah 66 in the BOVCB

Isaiah 66 in the BOYCB

Isaiah 66 in the BPBB

Isaiah 66 in the BPH

Isaiah 66 in the BSB

Isaiah 66 in the CCB

Isaiah 66 in the CUV

Isaiah 66 in the CUVS

Isaiah 66 in the DBT

Isaiah 66 in the DGDNT

Isaiah 66 in the DHNT

Isaiah 66 in the DNT

Isaiah 66 in the ELBE

Isaiah 66 in the EMTV

Isaiah 66 in the ESV

Isaiah 66 in the FBV

Isaiah 66 in the FEB

Isaiah 66 in the GGMNT

Isaiah 66 in the GNT

Isaiah 66 in the HARY

Isaiah 66 in the HNT

Isaiah 66 in the IRVA

Isaiah 66 in the IRVB

Isaiah 66 in the IRVG

Isaiah 66 in the IRVH

Isaiah 66 in the IRVK

Isaiah 66 in the IRVM

Isaiah 66 in the IRVM2

Isaiah 66 in the IRVO

Isaiah 66 in the IRVP

Isaiah 66 in the IRVT

Isaiah 66 in the IRVT2

Isaiah 66 in the IRVU

Isaiah 66 in the ISVN

Isaiah 66 in the JSNT

Isaiah 66 in the KAPI

Isaiah 66 in the KBT1ETNIK

Isaiah 66 in the KBV

Isaiah 66 in the KJV

Isaiah 66 in the KNFD

Isaiah 66 in the LBA

Isaiah 66 in the LBLA

Isaiah 66 in the LNT

Isaiah 66 in the LSV

Isaiah 66 in the MAAL

Isaiah 66 in the MBV

Isaiah 66 in the MBV2

Isaiah 66 in the MHNT

Isaiah 66 in the MKNFD

Isaiah 66 in the MNG

Isaiah 66 in the MNT

Isaiah 66 in the MNT2

Isaiah 66 in the MRS1T

Isaiah 66 in the NAA

Isaiah 66 in the NASB

Isaiah 66 in the NBLA

Isaiah 66 in the NBS

Isaiah 66 in the NBVTP

Isaiah 66 in the NET2

Isaiah 66 in the NIV11

Isaiah 66 in the NNT

Isaiah 66 in the NNT2

Isaiah 66 in the NNT3

Isaiah 66 in the PDDPT

Isaiah 66 in the PFNT

Isaiah 66 in the RMNT

Isaiah 66 in the SBIAS

Isaiah 66 in the SBIBS

Isaiah 66 in the SBIBS2

Isaiah 66 in the SBICS

Isaiah 66 in the SBIDS

Isaiah 66 in the SBIGS

Isaiah 66 in the SBIHS

Isaiah 66 in the SBIIS

Isaiah 66 in the SBIIS2

Isaiah 66 in the SBIIS3

Isaiah 66 in the SBIKS

Isaiah 66 in the SBIKS2

Isaiah 66 in the SBIMS

Isaiah 66 in the SBIOS

Isaiah 66 in the SBIPS

Isaiah 66 in the SBISS

Isaiah 66 in the SBITS

Isaiah 66 in the SBITS2

Isaiah 66 in the SBITS3

Isaiah 66 in the SBITS4

Isaiah 66 in the SBIUS

Isaiah 66 in the SBIVS

Isaiah 66 in the SBT

Isaiah 66 in the SBT1E

Isaiah 66 in the SCHL

Isaiah 66 in the SNT

Isaiah 66 in the SUSU

Isaiah 66 in the SUSU2

Isaiah 66 in the SYNO

Isaiah 66 in the TBIAOTANT

Isaiah 66 in the TBT1E

Isaiah 66 in the TBT1E2

Isaiah 66 in the TFTIP

Isaiah 66 in the TFTU

Isaiah 66 in the TGNTATF3T

Isaiah 66 in the THAI

Isaiah 66 in the TNFD

Isaiah 66 in the TNT

Isaiah 66 in the TNTIK

Isaiah 66 in the TNTIL

Isaiah 66 in the TNTIN

Isaiah 66 in the TNTIP

Isaiah 66 in the TNTIZ

Isaiah 66 in the TOMA

Isaiah 66 in the TTENT

Isaiah 66 in the UBG

Isaiah 66 in the UGV

Isaiah 66 in the UGV2

Isaiah 66 in the UGV3

Isaiah 66 in the VBL

Isaiah 66 in the VDCC

Isaiah 66 in the YALU

Isaiah 66 in the YAPE

Isaiah 66 in the YBVTP

Isaiah 66 in the ZBP