John 20 (BOICB)

1 Nʼisi ụtụtụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe chi na-abọzibeghị nke ọma, Meri Magdalin bịara nʼili ahụ, ma hụ na e wepụla nkume ahụ e jiri mechie ọnụ ili ahụ. 2 O ji ọsọ bịakwute Saimọn Pita na onye ọzọ ahụ nke na-eso ụzọ ya, bụ onye Jisọs hụrụ nʼanya sị, “Ha esitela nʼili ahụ bupụ Onyenwe anyị. Anyị amaghị ebe ha dobere ya!” 3 Ya mere Pita na onye nke ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya pụrụ gawa nʼili ahụ. 4 Ha abụọ jiri ọsọ na-aga, ma onye ọzọ ahụ na-eso ụzọ ya gbakarịrị Pita nʼọsọ buru ya ụzọ ruo nʼili ahụ. 5 O hulatara ala, nyoo anya nʼime ili, hụ akwa ọcha ahụ ebe ha wụsara nʼala, ma ọ baghị nʼime. 6 Ya mere Saimọn Pita, onye na-eso ya nʼazụ bịarutere banye nʼime ili ahụ. Ọ hụrụ akwa ozu ahụ ka ọ wụsara nʼala, 7 ya na akwa nke e ji kechie ya isi. Ịchafọ a na akwa ọcha ahụ adịkọtaghị nʼotu ebe, kama a pịara ya apịa dobe ya iche nʼebe ọzọ. 8 Onye ọzọ ahụ nke na-eso ụzọ ya, onye nke buru ụzọ bịaruo nʼili banyekwara nʼime ili ahụ. Ọ hụrụ ma kwerekwa. 9 (Ruo nʼoge a, ha aghọtabeghị site nʼakwụkwọ nsọ na ọ ghaghị i si nʼọnwụ bilie.) 10 Emesịa ndị na-eso ụzọ ya laghachiri nʼụlọ ha. 11 Ma Meri guzo nʼakụkụ ili ahụ na-ebe akwa. Mgbe ọ nọ na-ebe akwa, o hulatara ala nyoo anya nʼime ili ahụ 12 hụ ndị mmụọ ozi abụọ yi uwe ọcha, ka ha nọdụrụ ala otu nʼisi, nke ọzọ nʼụkwụ, nʼebe ahụ atọgbọrọ ahụ Jisọs. 13 Ha sịrị ya, “Nwanyị, gịnị mere i ji ebe akwa?”Ọ sịrị ha, “Ha ebupụla Onyenwe m, amaghị m ebe ha bujere ya.” 14 Nʼoge a, ọ tụgharịrị hụ ka Jisọs guzo nʼebe ahụ. Ma ọ mataghị na ọ bụ Jisọs. 15 Jisọs sịrị ya, “Nwanyị, gịnị mere iji ebe akwa? Onye ka ị na-achọ?”Ebe o chere na ọ bụ onye na-elekọta ogige ahụ, ọ sịrị ya, “Nna anyị ukwu, ọ bụrụ na ọ bụ gị bupụrụ ya, gwa m ebe i debere ya ka m gaa buru ya.” 16 Jisọs sịrị ya, “Meri.”Ọ tụgharịrị tie mkpu nʼolu Hibru sị ya, “Raboni!” (nke pụtara “Onye nkuzi.)” 17 Jisọs sịrị ya, “Emetụkwala m aka nʼihi na alakwurubeghị m Nna m. Kama gakwuru ụmụnna m gwa ha, ‘Ana m alakwuru Nna m na Nna unu. Chineke m na Chineke unu.’ ” 18 Meri Magdalin gara gwa ndị na-eso ụzọ ya, “Ahụla m Onyenwe anyị.” Ọ kọọrọ ha na ọ bụ ya gwara ya ihe ndị a niile. 19 Nʼuhuruchi nke ụbọchị ahụ, bụ ụbọchị mbụ nke izu ụka, mgbe ndị na-eso ụzọ ya zukọtara nʼime otu ụlọ. Ha mechiri ụzọ niile nʼihi egwu ndị Juu. Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu!” 20 Mgbe o kwusiri nke a, o gosiri ha aka ya na akụkụ ya. Ọṅụ juru ndị na-eso ụzọ ya obi nʼihi na ha ahụla Onyenwe anyị. 21 Ọzọkwa, Jisọs sịrị ha, “Udo dịrị unu! Dị ka Nna m si zite m, otu a ka m na-eziga unu.” 22 Mgbe o kwuchara nke a, o kusara ha ume sị ha, “Naranụ Mmụọ Nsọ. 23 Ọ bụrụ na unu agbaghara onye ọbụla mmehie ya, a ga-agbaghara ya, ọ bụrụkwa na unu ajụ ịgbaghara ha, agaghị agbaghara ha.” 24 Ma Tọmọs (onye a na-akpọ Didimọs), otu nʼime ndị ozi iri na abụọ ahụ, anọghị ya mgbe Jisọs bịara. 25 Ya mere, ndị ọzọ na-eso ụzọ ya gwara ya, “Anyị ahụla Onyenwe anyị!”Ma ọ sịrị ha, “Ọ bụ naanị mgbe m jiri anya m hụ ebe ahụ ntu kpọpuru ya aka, tinye mkpịsịaka m nʼapa ntu ndị ahụ, ma tinyekwa aka m nʼakụkụ ya ebe ahụ a mara ya ùbe, ka m ga-ekwere.” 26 Mgbe abalị asatọ gasịrị, ndị na-eso ụzọ ya zukọtara ọzọ. Ugbu a Tọmọs nọkwa nʼetiti ha. Nʼagbanyeghị na e mechisịrị ụzọ niile, Jisọs batara guzo nʼetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu.” 27 Mgbe ahụ ọ sịrị Tọmọs, “Rụnye mkpịsịaka gị nʼebe a, leekwa aka m abụọ. Wepụta aka gị tinyekwa nʼakụkụ m. Abụla onye na-enweghị okwukwe, kama kwere.” 28 Tọmọs zara sị ya, “Onyenwe m na Chineke m!” 29 Ma Jisọs sịrị ya, “I kweere nʼihi na ị hụla m? Ma ngọzị dịrị ndị na-ahụghị ma kwere.” 30 Ọ dị ọtụtụ ihe ịrịbama ndị ọzọ Jisọs rụrụ nʼihu ndị na-eso ụzọ ya. Ma edeghị ha nʼime akwụkwọ a. 31 Ma e dere ihe ndị a niile ka unu kwere na Jisọs bụ Kraịst, Ọkpara Chineke. Nʼihi na ọ bụ site nʼikwere ka unu ga-eji nweta ndụ ọhụrụ site nʼaha ya.

In Other Versions

John 20 in the ANGEFD

John 20 in the ANTPNG2D

John 20 in the AS21

John 20 in the BAGH

John 20 in the BBPNG

John 20 in the BBT1E

John 20 in the BDS

John 20 in the BEV

John 20 in the BHAD

John 20 in the BIB

John 20 in the BLPT

John 20 in the BNT

John 20 in the BNTABOOT

John 20 in the BNTLV

John 20 in the BOATCB

John 20 in the BOATCB2

John 20 in the BOBCV

John 20 in the BOCNT

John 20 in the BOECS

John 20 in the BOGWICC

John 20 in the BOHCB

John 20 in the BOHCV

John 20 in the BOHLNT

John 20 in the BOHNTLTAL

John 20 in the BOILNTAP

John 20 in the BOITCV

John 20 in the BOKCV

John 20 in the BOKCV2

John 20 in the BOKHWOG

John 20 in the BOKSSV

John 20 in the BOLCB

John 20 in the BOLCB2

John 20 in the BOMCV

John 20 in the BONAV

John 20 in the BONCB

John 20 in the BONLT

John 20 in the BONUT2

John 20 in the BOPLNT

John 20 in the BOSCB

John 20 in the BOSNC

John 20 in the BOTLNT

John 20 in the BOVCB

John 20 in the BOYCB

John 20 in the BPBB

John 20 in the BPH

John 20 in the BSB

John 20 in the CCB

John 20 in the CUV

John 20 in the CUVS

John 20 in the DBT

John 20 in the DGDNT

John 20 in the DHNT

John 20 in the DNT

John 20 in the ELBE

John 20 in the EMTV

John 20 in the ESV

John 20 in the FBV

John 20 in the FEB

John 20 in the GGMNT

John 20 in the GNT

John 20 in the HARY

John 20 in the HNT

John 20 in the IRVA

John 20 in the IRVB

John 20 in the IRVG

John 20 in the IRVH

John 20 in the IRVK

John 20 in the IRVM

John 20 in the IRVM2

John 20 in the IRVO

John 20 in the IRVP

John 20 in the IRVT

John 20 in the IRVT2

John 20 in the IRVU

John 20 in the ISVN

John 20 in the JSNT

John 20 in the KAPI

John 20 in the KBT1ETNIK

John 20 in the KBV

John 20 in the KJV

John 20 in the KNFD

John 20 in the LBA

John 20 in the LBLA

John 20 in the LNT

John 20 in the LSV

John 20 in the MAAL

John 20 in the MBV

John 20 in the MBV2

John 20 in the MHNT

John 20 in the MKNFD

John 20 in the MNG

John 20 in the MNT

John 20 in the MNT2

John 20 in the MRS1T

John 20 in the NAA

John 20 in the NASB

John 20 in the NBLA

John 20 in the NBS

John 20 in the NBVTP

John 20 in the NET2

John 20 in the NIV11

John 20 in the NNT

John 20 in the NNT2

John 20 in the NNT3

John 20 in the PDDPT

John 20 in the PFNT

John 20 in the RMNT

John 20 in the SBIAS

John 20 in the SBIBS

John 20 in the SBIBS2

John 20 in the SBICS

John 20 in the SBIDS

John 20 in the SBIGS

John 20 in the SBIHS

John 20 in the SBIIS

John 20 in the SBIIS2

John 20 in the SBIIS3

John 20 in the SBIKS

John 20 in the SBIKS2

John 20 in the SBIMS

John 20 in the SBIOS

John 20 in the SBIPS

John 20 in the SBISS

John 20 in the SBITS

John 20 in the SBITS2

John 20 in the SBITS3

John 20 in the SBITS4

John 20 in the SBIUS

John 20 in the SBIVS

John 20 in the SBT

John 20 in the SBT1E

John 20 in the SCHL

John 20 in the SNT

John 20 in the SUSU

John 20 in the SUSU2

John 20 in the SYNO

John 20 in the TBIAOTANT

John 20 in the TBT1E

John 20 in the TBT1E2

John 20 in the TFTIP

John 20 in the TFTU

John 20 in the TGNTATF3T

John 20 in the THAI

John 20 in the TNFD

John 20 in the TNT

John 20 in the TNTIK

John 20 in the TNTIL

John 20 in the TNTIN

John 20 in the TNTIP

John 20 in the TNTIZ

John 20 in the TOMA

John 20 in the TTENT

John 20 in the UBG

John 20 in the UGV

John 20 in the UGV2

John 20 in the UGV3

John 20 in the VBL

John 20 in the VDCC

John 20 in the YALU

John 20 in the YAPE

John 20 in the YBVTP

John 20 in the ZBP