Job 33 (BOICB)

1 “Ma ugbu a, Job, gee ntị nʼokwu m;ṅaakwa ntị nke ọma nʼihe niile m ga-ekwu. 2 Ejikerela m imeghe ọnụ m ikwu okwu;okwu m dịkwa nʼọnụ ire m. 3 Okwu m sitere nʼizi ezi nke obi m;egbugbere ọnụ m na-ekwu naanị eziokwu nke m ma. 4 Ọ bụ Mmụọ nke Chineke mere m,nkuume nke Onye pụrụ ime ihe niile na-enye m ndụ. 5 Zaghachi m ma ọ bụrụ na i nwere ike;jikere onwe gị ka anyị rụrịtaa ụka. 6 Mụ onwe m dị ka i si dị nʼihu Chineke;mụ onwe m bụkwa ihe esitere nʼụrọ kpuo. 7 Egwu m ekwesighị ime ka ị tụọ oke ụjọ,ma ọ bụkwanụ ogwe aka m ịdị arọ nʼahụ gị. 8 “Ma ị kwuola ya na ntị m,anụrụ m okwu ndị ahụ niile, 9 ‘Mụ onwe m dị ọcha nʼobi m, o nweghị ihe na-ezighị ezi m mere;adị m ọcha na-enweghị mmehie ọbụla. 10 Ma Chineke chọtara ezughị oke nʼebe m nọ;ọ na-ahụta m dịka onye iro ya. 11 Ọ na-eji mkpọrọ kechie ụkwụ m abụọ;ọ na-enyochakwa ụzọ m niile.’ 12 “Ma ana m agwa gị, na nke a i meghị nke ọma,nʼihi na Chineke dị elu karịa mmadụ. 13 Gịnị mere i ji na-ekpesara yana ọ dịghị azaghachi mmadụ ọbụla okwu? 14 Ma Chineke na-ekwu okwu, ugbu a nʼotu ụzọ, ugbu a kwa nʼụzọ ọzọ,ọ bụ ezie na mmadụ nwere ike ghara ịghọta ya. 15 Na nrọ maọbụ nʼọhụ nke abalị,mgbe ụmụ mmadụ na-ada nʼoke ụra,mgbe ha na-atụgharị nʼelu ihe ndina ha. 16 O nwere ike kwunye ha okwu na ntịma mee ka egwu tụọ ha site nʼọtụtụ ịdọ aka na ntị; 17 ka mmadụ si nʼajọ omume ya chegharịa,ka o si na nganga ya wezuga onwe ya, 18 ka o chebe mkpụrụobi ya site nʼolulu,chebekwa ndụ ya site nʼịla nʼiyi nke mma agha. 19 “Ọzọkwa, a na-abara mmadụ mba site nʼihe mgbu nke na-eme ka o dinara nʼelu ihe ndina,ebe ọkpụkpọ niile dị ya nʼahụ na-anọgide na-egbu ya mgbu. 20 Nke na-eme ka ndụ ya na-asọ ihe oriri oyi,ọzọ, mkpụrụobi ya na-ajụkwa nri dịkarịsịrị ụtọ. 21 Anụ ahụ ya na-abụ ihe na-ala nʼiyi,ma ọkpụkpụ ya; nke bụ ihe zoro ezo na mbụ, na-apụta ihe ugbu a. 22 Mkpụrụobi ya na-abịaru ili nso,ndụ ha na-anọkwa nso nʼaka ndị na-ejere ọnwụ ozi. 23 Ma a sị na e nwere mmụọ ozi nọ ya nʼakụkụ,dịka onye nkwuchite ọnụ, otu onye nʼetiti puku mmadụ,onye ga-agwa mmadụ ihe ziri ezi nye ya, 24 ọ na-emere onye ahụ amara, na-asịkwa Chineke,‘Napụta ya, ekwela ka ọ gbadaa nʼime olulu ili;achọtala ihe mgbapụta nʼihi ya. 25 Ka ahụ ya nwogharịa dịka nke nwantakịrị,ka a eweghachi ike ya dịka ọ dị nʼụbọchị okorobịa ya.’ 26 Mgbe ahụ, onye ahụ ga-arịọ Chineke arịrịọ ma chọtakwa ihuọma ya,ha ga-ahụ ihu Chineke ma tiekwa mkpu ọṅụ,ọ na-enyeghachi ha ezi ihe nʼihi ezi omume ya. 27 Mgbe ahụ, ọ na-abịakwute ụmụ mmadụ sị ha:‘Emehiere m, mee ihe ziri ezi ka ọ bụrụ ajọ omume,ma anataghị m ihe kwesiri ịbụ ụgwọ ọrụ m; 28 ọ gbapụtara mkpụrụobi m ka m ghara ịrịda nʼolulu ili,ya mere aga m adị ndụ hụkwa ìhè nke ndụ.’ 29 “Ihe ndị a niile ka Chineke na-emere mmadụugboro abụọ, ọbụladị ugboro atọ. 30 Ka ọ dọghachite mkpụrụobi ya site nʼolulu ili,ka ìhè nke ndụ si otu a mụkwasị ya. 31 “Gee ntị, Job, ma nụrụ okwu m;dere jii ka m kwuo okwu. 32 Ọ bụrụ na i nwere ihe ị chọrọ ikwu, zaghachi m;kwupụ okwu, nʼihi na achọrọ m ịgụ gị nʼonye ezi omume. 33 Ma ọ bụghị otu a, gee m ntị;dere jii, ka m zi gị amamihe.”

In Other Versions

Job 33 in the ANGEFD

Job 33 in the ANTPNG2D

Job 33 in the AS21

Job 33 in the BAGH

Job 33 in the BBPNG

Job 33 in the BBT1E

Job 33 in the BDS

Job 33 in the BEV

Job 33 in the BHAD

Job 33 in the BIB

Job 33 in the BLPT

Job 33 in the BNT

Job 33 in the BNTABOOT

Job 33 in the BNTLV

Job 33 in the BOATCB

Job 33 in the BOATCB2

Job 33 in the BOBCV

Job 33 in the BOCNT

Job 33 in the BOECS

Job 33 in the BOGWICC

Job 33 in the BOHCB

Job 33 in the BOHCV

Job 33 in the BOHLNT

Job 33 in the BOHNTLTAL

Job 33 in the BOILNTAP

Job 33 in the BOITCV

Job 33 in the BOKCV

Job 33 in the BOKCV2

Job 33 in the BOKHWOG

Job 33 in the BOKSSV

Job 33 in the BOLCB

Job 33 in the BOLCB2

Job 33 in the BOMCV

Job 33 in the BONAV

Job 33 in the BONCB

Job 33 in the BONLT

Job 33 in the BONUT2

Job 33 in the BOPLNT

Job 33 in the BOSCB

Job 33 in the BOSNC

Job 33 in the BOTLNT

Job 33 in the BOVCB

Job 33 in the BOYCB

Job 33 in the BPBB

Job 33 in the BPH

Job 33 in the BSB

Job 33 in the CCB

Job 33 in the CUV

Job 33 in the CUVS

Job 33 in the DBT

Job 33 in the DGDNT

Job 33 in the DHNT

Job 33 in the DNT

Job 33 in the ELBE

Job 33 in the EMTV

Job 33 in the ESV

Job 33 in the FBV

Job 33 in the FEB

Job 33 in the GGMNT

Job 33 in the GNT

Job 33 in the HARY

Job 33 in the HNT

Job 33 in the IRVA

Job 33 in the IRVB

Job 33 in the IRVG

Job 33 in the IRVH

Job 33 in the IRVK

Job 33 in the IRVM

Job 33 in the IRVM2

Job 33 in the IRVO

Job 33 in the IRVP

Job 33 in the IRVT

Job 33 in the IRVT2

Job 33 in the IRVU

Job 33 in the ISVN

Job 33 in the JSNT

Job 33 in the KAPI

Job 33 in the KBT1ETNIK

Job 33 in the KBV

Job 33 in the KJV

Job 33 in the KNFD

Job 33 in the LBA

Job 33 in the LBLA

Job 33 in the LNT

Job 33 in the LSV

Job 33 in the MAAL

Job 33 in the MBV

Job 33 in the MBV2

Job 33 in the MHNT

Job 33 in the MKNFD

Job 33 in the MNG

Job 33 in the MNT

Job 33 in the MNT2

Job 33 in the MRS1T

Job 33 in the NAA

Job 33 in the NASB

Job 33 in the NBLA

Job 33 in the NBS

Job 33 in the NBVTP

Job 33 in the NET2

Job 33 in the NIV11

Job 33 in the NNT

Job 33 in the NNT2

Job 33 in the NNT3

Job 33 in the PDDPT

Job 33 in the PFNT

Job 33 in the RMNT

Job 33 in the SBIAS

Job 33 in the SBIBS

Job 33 in the SBIBS2

Job 33 in the SBICS

Job 33 in the SBIDS

Job 33 in the SBIGS

Job 33 in the SBIHS

Job 33 in the SBIIS

Job 33 in the SBIIS2

Job 33 in the SBIIS3

Job 33 in the SBIKS

Job 33 in the SBIKS2

Job 33 in the SBIMS

Job 33 in the SBIOS

Job 33 in the SBIPS

Job 33 in the SBISS

Job 33 in the SBITS

Job 33 in the SBITS2

Job 33 in the SBITS3

Job 33 in the SBITS4

Job 33 in the SBIUS

Job 33 in the SBIVS

Job 33 in the SBT

Job 33 in the SBT1E

Job 33 in the SCHL

Job 33 in the SNT

Job 33 in the SUSU

Job 33 in the SUSU2

Job 33 in the SYNO

Job 33 in the TBIAOTANT

Job 33 in the TBT1E

Job 33 in the TBT1E2

Job 33 in the TFTIP

Job 33 in the TFTU

Job 33 in the TGNTATF3T

Job 33 in the THAI

Job 33 in the TNFD

Job 33 in the TNT

Job 33 in the TNTIK

Job 33 in the TNTIL

Job 33 in the TNTIN

Job 33 in the TNTIP

Job 33 in the TNTIZ

Job 33 in the TOMA

Job 33 in the TTENT

Job 33 in the UBG

Job 33 in the UGV

Job 33 in the UGV2

Job 33 in the UGV3

Job 33 in the VBL

Job 33 in the VDCC

Job 33 in the YALU

Job 33 in the YAPE

Job 33 in the YBVTP

Job 33 in the ZBP