Lamentations 1 (BOICB)

1 Lee ka obodo ahụ nke ndị ya dị ọtụtụsi bụrụ ebe tọgbọrọ nʼefu!Lee ka o si ghọọ nwanyị di ya nwụrụ,bụ obodo ahụ a maara aha ya nʼetiti mba niile.Lee ka onye naara abụ eze nwanyị nʼetiti ala niile a na-achị achịsi ghọọ ohu. 2 Ọ na-akwasị akwa ike nʼabalị,anya mmiri na-asọdakwa na nti ya,nʼetiti ndị ahụ niile hụrụ ya nʼanya,ọ dịghị onye na-akasị ya obi.Ndị enyi ya niile aghọgbuola ya;ha niile aghọọla ndị iro ya. 3 Juda ejeela biri nʼala ọzọ,mgbe o siri nʼọnọdụ mweda nʼala na ndọgbu nʼọrụ pụta.Ọ na-ebi nʼetiti mba dị iche iche,ma ọ chọtaghị ebe izuike ọbụla.Nʼetiti nhụju anya yandị niile na-achụ ya ọsọ achụkwutela ya. 4 Okporoụzọ niile e si eje Zayọn na-eru ụjụ,nʼihi na ọ dịghị onye na-abịakwa na mmemme ndị ahụ a kara aka.Ọnụ ụzọ ama ya niile atọgbọrọla nʼefu,ndị nchụaja ya na-asụ ude,ụmụ agbọghọ nọ nʼọnọdụ mwute,ya onwe ya nọkwa nʼọnọdụ dị ilu. 5 Ndị iro ya aghọọla ndị na-achị ya;ndị iro ya nọ nʼahụ udo.Nʼihi na ONYENWE ANYỊ emekpaala ya ahụ,nʼihi ịba ụba nke njehie ya niile.E burula ụmụntakịrị ya bulaa mba ọzọ,dịka ndị a dọtara nʼagha. 6 Ịma mma niileesitela nʼahụ ada Zayọn pụọ.Ụmụ eze ya dị ka elenke na-enweghị ike ịchọta ebe ịta nri.Nʼihi adịghị ike ha,ha esitela nʼihu ndị na-achụ ha ọsọ gbalaga. 7 Nʼụbọchị ndị ahụ niile e wedara ya nʼala,Jerusalem echetala akụ ndị ahụ niile bụ nke ya na mgbe ochie.Jerusalem echetala ha nʼụbọchị ndị ahụ niile ọ na-awagharị.Mgbe ndị ya dabara nʼaka ndị iro ya,o nweghị onye inyeaka ha hụrụ.Nʼoge ahụ, ndị iro ya hụrụ ọnọdụya, chịa ya ọchị. 8 Jerusalem emehiela nke ukwu,nʼezie, ọ ghọọla ihe rụrụ arụ.Ndị ahụ niile na-asọpụrụ ya na mbụ elelịala ya anya,nʼihi na ha ahụla ọtọ ya.Ya onwe ya kwa na-asụ ude,ma chigharịakwa azụ. 9 Ịrụ arụ ya pụtara ihe, ọ bụladị nʼuwe ya.Ọ dịkwaghị mgbe o chere echiche banyere ihe dị na-eche ya nʼoge dị nʼihu.Lee ka o si daa, dasie ike,ma ọ dịghị onye bịara kasịe ya obi.“ONYENWE ANYỊ, lee nsogbu m niile.Lee ka ndị iro si merie m.” 10 Onye iro agbasaala aka yachịkọtaa akụ ya niile.O ji anya ya hụ ka mba ndị ọzọ dị iche ichesi bata ebe nsọ ya.Ndị ahụ na-ekwesighị ịbatabụ ndị batara nʼebe nzukọ gị. 11 Ndị ya niile na-asụ udemgbe ha na-achọ ihe ha ga-eri.Ha na-ewere ihe ha nwere nye nʼihi oriri,ime ka ha nwee ike dịrị ndụ.“ONYENWE ANYỊ, lee, ma tuleekwa ihe ndị a niile,nʼihi na abụrụla m onye a na-elelị.” 12 “Ọ bụ na ọ dịghị emetụ unu nʼobi, unu ndị niile na-esi ebe a na-agafe?Legharịanụ anya unu ka unu hụrụ.O nwere ahụhụ dịka ahụhụ m,nke e mere ka ọ bịakwasị m,bụ nke ONYENWE ANYỊ mere ka ọ bịakwasị m,nʼụbọchị ọ na-ewe iwe ya dị ọkụ? 13 “O si nʼelu zite ọkụ,e, o zitere ọkụ nke na-ere nʼime ọkpụkpụ m.Ọ gbasara ụgbụ nʼebe ụkwụ m ga-esi gafee,meekwa ka m laghachi azụ.O mere ka m bụrụ ihe tọgbọrọ nʼefu,onye na-ada mba ogologo ụbọchị niile. 14 “Ọ na-eleru anya na mmehie m niile;jiri aka ya na-akpa ha dịka ụdọ.A nyakwasịla ya nʼolu m.Onyenwe anyị emeela ka ike gwụsịa m.O werela m nyefee nʼaka ndị ahụm na-apụghị iguzogide. 15 “Onyenwe anyị ajụlandị niile bụ dike nʼagha nọ nʼetiti m.Ọ kpọkuola usuu ndị agha ka ha bịa buo agha megide m,ka ha bịa gwepịa ụmụ okorobịa m niile.Nʼebe ịzọcha mkpụrụ vaịnị yaka Onyenwe anyị zọchara ada Juda na-amaghị nwoke. 16 “Ọ bụ nke a mere m ji akwa akwa.Ọ bụ ya mekwara anya mmiri ji ju m anya.O nweghị onye nkasiobi ọbụla nọ m nso;o nwekwaghị onye ga-akpọghachi mkpụrụobi m.Ụmụ m atọgbọla nʼefu,nʼihi na onye iro emeriela.” 17 Lee ka Zayọn si gbasapụ aka yama o nweghị onye nkasiobi o nwere. ONYENWE ANYỊ enyela iwu banyere Jekọbna ndị agbataobi ya ga-aghọ ndị iro ya.Jerusalem aghọkwaalaihe rụrụ arụ nʼetiti ha. 18 “Ma ONYENWE ANYỊ bụ onye ezi omume.Ọ bụ mụ onwe m nupuru isi nʼiwu ya.Geenụ ntị unu ndị niile,leenụ anya nʼụdị ahụhụ dakwasịrị m.A dọtala ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa m niile nʼaghaburu ha jee mba ọzọ. 19 “Akpọkuru m ndị mụ na ha dị na mma,ma ha ghọgburu m.Ndị nchụaja m na ndị okenye mnwụrụ nʼime obodomgbe ha nọ na-achọta nriha ga-eji debe onwe ha ndụ. 20 “Lee, ONYENWE ANYỊ, ka m si bụrụ onye ahụhụ dị ukwuu dakwasịrị.Ime anụ ahụ m na-anụ ọkụ,obi m kwa enweghị izuike nʼime mnʼihi na onye nnupu isi dị ukwuu ka m bụ.Nʼezi, ọ bụ mma agha ka a ga-eji mee ka mmadụ gbara aka nwa.Ma nʼime ụlọ, ọ bụ naanị ọnwụ dị ya. 21 “Ndị mmadụ anụla olu ịsụ ude m,ma o nweghị onye bịara ịkasị m obi.Ndị iro m niile anụla akụkọ ihe ọjọọ dakwasịrị m,ma ha na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼihi ihe i mere ka ọ bịakwasị m.Mee ka ụbọchị ahụ i kara aka bịa,nke ga-eme ka ha dịrị ka m dị. 22 “Kwere ka ihe ọjọọ niile ha na-eme bịa nʼihu gị.Mesokwa ha mmesodịka i si mesoo mnʼihi mmehie niile nke m.Nʼihi na ịsụ ude m dị ọtụtụ,ana m adakwa mba nʼobi m.”

In Other Versions

Lamentations 1 in the ANGEFD

Lamentations 1 in the ANTPNG2D

Lamentations 1 in the AS21

Lamentations 1 in the BAGH

Lamentations 1 in the BBPNG

Lamentations 1 in the BBT1E

Lamentations 1 in the BDS

Lamentations 1 in the BEV

Lamentations 1 in the BHAD

Lamentations 1 in the BIB

Lamentations 1 in the BLPT

Lamentations 1 in the BNT

Lamentations 1 in the BNTABOOT

Lamentations 1 in the BNTLV

Lamentations 1 in the BOATCB

Lamentations 1 in the BOATCB2

Lamentations 1 in the BOBCV

Lamentations 1 in the BOCNT

Lamentations 1 in the BOECS

Lamentations 1 in the BOGWICC

Lamentations 1 in the BOHCB

Lamentations 1 in the BOHCV

Lamentations 1 in the BOHLNT

Lamentations 1 in the BOHNTLTAL

Lamentations 1 in the BOILNTAP

Lamentations 1 in the BOITCV

Lamentations 1 in the BOKCV

Lamentations 1 in the BOKCV2

Lamentations 1 in the BOKHWOG

Lamentations 1 in the BOKSSV

Lamentations 1 in the BOLCB

Lamentations 1 in the BOLCB2

Lamentations 1 in the BOMCV

Lamentations 1 in the BONAV

Lamentations 1 in the BONCB

Lamentations 1 in the BONLT

Lamentations 1 in the BONUT2

Lamentations 1 in the BOPLNT

Lamentations 1 in the BOSCB

Lamentations 1 in the BOSNC

Lamentations 1 in the BOTLNT

Lamentations 1 in the BOVCB

Lamentations 1 in the BOYCB

Lamentations 1 in the BPBB

Lamentations 1 in the BPH

Lamentations 1 in the BSB

Lamentations 1 in the CCB

Lamentations 1 in the CUV

Lamentations 1 in the CUVS

Lamentations 1 in the DBT

Lamentations 1 in the DGDNT

Lamentations 1 in the DHNT

Lamentations 1 in the DNT

Lamentations 1 in the ELBE

Lamentations 1 in the EMTV

Lamentations 1 in the ESV

Lamentations 1 in the FBV

Lamentations 1 in the FEB

Lamentations 1 in the GGMNT

Lamentations 1 in the GNT

Lamentations 1 in the HARY

Lamentations 1 in the HNT

Lamentations 1 in the IRVA

Lamentations 1 in the IRVB

Lamentations 1 in the IRVG

Lamentations 1 in the IRVH

Lamentations 1 in the IRVK

Lamentations 1 in the IRVM

Lamentations 1 in the IRVM2

Lamentations 1 in the IRVO

Lamentations 1 in the IRVP

Lamentations 1 in the IRVT

Lamentations 1 in the IRVT2

Lamentations 1 in the IRVU

Lamentations 1 in the ISVN

Lamentations 1 in the JSNT

Lamentations 1 in the KAPI

Lamentations 1 in the KBT1ETNIK

Lamentations 1 in the KBV

Lamentations 1 in the KJV

Lamentations 1 in the KNFD

Lamentations 1 in the LBA

Lamentations 1 in the LBLA

Lamentations 1 in the LNT

Lamentations 1 in the LSV

Lamentations 1 in the MAAL

Lamentations 1 in the MBV

Lamentations 1 in the MBV2

Lamentations 1 in the MHNT

Lamentations 1 in the MKNFD

Lamentations 1 in the MNG

Lamentations 1 in the MNT

Lamentations 1 in the MNT2

Lamentations 1 in the MRS1T

Lamentations 1 in the NAA

Lamentations 1 in the NASB

Lamentations 1 in the NBLA

Lamentations 1 in the NBS

Lamentations 1 in the NBVTP

Lamentations 1 in the NET2

Lamentations 1 in the NIV11

Lamentations 1 in the NNT

Lamentations 1 in the NNT2

Lamentations 1 in the NNT3

Lamentations 1 in the PDDPT

Lamentations 1 in the PFNT

Lamentations 1 in the RMNT

Lamentations 1 in the SBIAS

Lamentations 1 in the SBIBS

Lamentations 1 in the SBIBS2

Lamentations 1 in the SBICS

Lamentations 1 in the SBIDS

Lamentations 1 in the SBIGS

Lamentations 1 in the SBIHS

Lamentations 1 in the SBIIS

Lamentations 1 in the SBIIS2

Lamentations 1 in the SBIIS3

Lamentations 1 in the SBIKS

Lamentations 1 in the SBIKS2

Lamentations 1 in the SBIMS

Lamentations 1 in the SBIOS

Lamentations 1 in the SBIPS

Lamentations 1 in the SBISS

Lamentations 1 in the SBITS

Lamentations 1 in the SBITS2

Lamentations 1 in the SBITS3

Lamentations 1 in the SBITS4

Lamentations 1 in the SBIUS

Lamentations 1 in the SBIVS

Lamentations 1 in the SBT

Lamentations 1 in the SBT1E

Lamentations 1 in the SCHL

Lamentations 1 in the SNT

Lamentations 1 in the SUSU

Lamentations 1 in the SUSU2

Lamentations 1 in the SYNO

Lamentations 1 in the TBIAOTANT

Lamentations 1 in the TBT1E

Lamentations 1 in the TBT1E2

Lamentations 1 in the TFTIP

Lamentations 1 in the TFTU

Lamentations 1 in the TGNTATF3T

Lamentations 1 in the THAI

Lamentations 1 in the TNFD

Lamentations 1 in the TNT

Lamentations 1 in the TNTIK

Lamentations 1 in the TNTIL

Lamentations 1 in the TNTIN

Lamentations 1 in the TNTIP

Lamentations 1 in the TNTIZ

Lamentations 1 in the TOMA

Lamentations 1 in the TTENT

Lamentations 1 in the UBG

Lamentations 1 in the UGV

Lamentations 1 in the UGV2

Lamentations 1 in the UGV3

Lamentations 1 in the VBL

Lamentations 1 in the VDCC

Lamentations 1 in the YALU

Lamentations 1 in the YAPE

Lamentations 1 in the YBVTP

Lamentations 1 in the ZBP