Job 31 (BOICB)

1 “Mụ na anya m gbara ndụ kpebiena o nweghị mgbe m ga-ele nwaagbọghọ ọbụla anya nʼihi agụụ ịkwa iko. 2 Nʼihi na, gịnị bụ oke mmadụ ketara nʼaka Chineke onye bi nʼelu;gịnị bụkwa ihe nketa ya site nʼaka Onye pụrụ ime ihe niile nọ nʼelu? 3 Ọ bụghị mbibi nye ndị ajọ omume,nhụju anya nye ndị na-eme ihe ọjọọ? 4 Ọ bụ na ọ naghị ahụ ụzọ m niile,gụọkwa nzọ ukwu m niile ọnụ? 5 “Ọ bụrụ na m gara ije nʼụzọ ụghamaọbụ na ụkwụ m mere ngwangwa gbasoro ụzọ aghụghọ, 6 ka Chineke were ihe ọtụtụ ziri ezi tụọ m,ọ ga-amata na m bụ onye na-enweghị ịta ụta. 7 Ọ bụrụ na nzọ ụkwụ m si nʼụzọ wezuga onwe ya,ọ bụrụ anya m na-edu obi m,ma ọ bụkwanụ na aka m abụọ bụ ihe e merụrụ emerụ, 8 ọ bụrụ otu a, ka onye ọzọ rie ihe m kụrụ nʼubi,ka e hopuchakwa ihe niile m kụrụ nʼubi. 9 “Ọ bụrụ na ọ gụọla obi m agụụ ijekwuru nwanyị ọzọ,maọbụ na m ezoola nʼọnụ ụzọ onye agbataobi m, 10 mgbe ahụ, ka nwunye m kwọọrọ nwoke ọzọ nri,ka ndị ikom ọzọ dinaa ya. 11 Nʼihi na nke ahụ ga-abụ ihe ihere,bụrụkwa mmehie kwesiri ka e kpee ya ikpe. 12 Ọ bụ ọkụ na-ere ruo nʼebe ịla nʼiyi;nke pụrụ ihopu ihe owuwe ubi m niile. 13 “Ọ bụrụ na m jụrụ ikpe ikpe ziri ezinye nwoke maọbụ nwanyị ọbụla na-ejere m ozimgbe ha nwere mkpesa megide m, 14 gịnị ka m ga-eme mgbe Chineke bịakwutere m?Gịnị ka m ga-aza ya mgbe ọ jụrụ m ajụjụ? 15 Ọ bụ na ọ bụghị onye kpụrụ m nʼafọ nne m mekwara ha?Ọ bụghị ya kpụrụ anyị abụọ nʼafọ nne anyị? 16 “Ọ bụrụ na m ajụ inye ndị ogbenye ihe dị ha mkpa,ma ọ bụrụkwa na m eme ka anya nwanyị di ya nwụrụ dalaa ya nʼisi, 17 ọ bụrụ na m dobere ihe oriri m maka naanị m,ma jụ inye ya ụmụ mgbei; 18 ma site nʼokorobịa m, azụlitere m ha dịka nna kwesiri,ọ bụkwa site na nwantakịrị ka m bụ onyendu nye nwanyị di ya nwụrụ. 19 Ọ bụrụ na ọ dị mgbe m hụrụ onye na-ala nʼiyi nʼihi enweghị akwa,maọbụ onye nọ nʼụkọ nke na-enweghị uwe, 20 ma obi ha agọzighị mnʼihi iji ajị sitere nʼụmụ atụrụ m mee ka o nwee okpomọkụ nʼahụ ya. 21 Ọ bụrụ na m eweliela aka m megide onye nna ya nwụrụ,nʼihi na m mara na m nwere nkwuwa okwu nʼụlọikpe, 22 mgbe ahụ, ka aka m si nʼubu m dapụ,ka e tijiekwa ogwe aka m site na nkwonkwo ya. 23 Nʼihi na atụrụ m egwu mbibi na-esite nʼaka Chineke,nʼihi egwu ebube ya, enweghị m ike ime ihe ndị a. 24 “Ọ bụrụ na ntụkwasị obi m dị nʼọlaedo,maọbụ na m sị ọlaedo a nụchara anụcha, ‘Ị bụ ebe ndabere m.’ 25 Ọ bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ nʼihi oke akụ m,ihe nnweta nke aka m ritere nʼuru, 26 ọ bụrụ na m legidere anyanwụ anya nʼebube ya,maọbụ ọnwa nʼike nchawa ya, 27 nke ga-eme ka obi m bụrụ ihe a rafuru na nzuzo,maọbụ aka m abụrụ ihe e weliri ife ha ofufe, 28 mgbe ahụ, ihe ndị a ga-abụ mmehie nke a ga-ekpe ikpe,nʼihi na m gaara abụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Chineke, Onye bi nʼelu. 29 “Ọ bụrụ na m ṅụrịrị ọṅụ nʼihi ọdachi nke dakwasịrị onye iro mmaọbụ chịa ọchị nʼihi nsogbu nke dakwasịrị ya, 30 ekwebeghị m ka ọnụ m mehiemegide ha site nʼịbụ ndụ ha ọnụ. 31 Ọ bụrụ na o nwebeghị oge ndị nọ nʼezinaụlọ m kwuru okwu sị.‘Onye ka ọ bụ nke na-erijubeghị afọ site nʼihe oriri Job na-enye?’ 32 Ma ọ dịghị onye ọbịa na-anọ ọnọdụ abalị nʼama,nʼihi ụzọ m na-eghe oghe mgbe ọbụla nye ndị ije. 33 Ọ bụrụ na m na-ezo mmehie m dịka ndị ọzọ,site nʼizobe mmehie m nʼime obi m, 34 nʼihi na m tụrụ egwu igwe mmadụ,si otu a, tụọ oke egwu nʼihi nleda anya nke ndị agbụrụ dị iche iche,nke mere ka m gbaa nkịtị ghara ịpụ nʼezi. 35 (“O, a sị na o nwere onye ga-ege m ntị!Ana m ebinye aka m nʼokwu ngọpụ m, ka Onye pụrụ ime ihe niile za m,ka onye na-ebo m ebubo depụta ihe o nwere megide m nʼakwụkwọ. 36 Nʼezie, aga m eyiri ya nʼubu m,aga m eyinyekwa ya dịka okpueze. 37 Aga m agụkọrọ ya nzọ ụkwụ m niile,aga m ejekwuru ya dịka ọkpara eze.) 38 “Ọ bụrụ na ala m etie mkpu megide m,ọ bụrụ na olulu dị na ya ejupụta nʼanya mmiri, 39 ọ bụrụ na m eripịa ihe o mepụtara na-akwụghị ụgwọ,maọbụ mee ka mmụọ ndị bi nʼime ya daa mba, 40 ka ogwu pupụta nʼọnọdụ ọka wiiti,ka ahịhịa na-esi isi ọjọọ pupụtakwa nʼọnọdụ ọka balị.”Okwu Job agwụla.

In Other Versions

Job 31 in the ANGEFD

Job 31 in the ANTPNG2D

Job 31 in the AS21

Job 31 in the BAGH

Job 31 in the BBPNG

Job 31 in the BBT1E

Job 31 in the BDS

Job 31 in the BEV

Job 31 in the BHAD

Job 31 in the BIB

Job 31 in the BLPT

Job 31 in the BNT

Job 31 in the BNTABOOT

Job 31 in the BNTLV

Job 31 in the BOATCB

Job 31 in the BOATCB2

Job 31 in the BOBCV

Job 31 in the BOCNT

Job 31 in the BOECS

Job 31 in the BOGWICC

Job 31 in the BOHCB

Job 31 in the BOHCV

Job 31 in the BOHLNT

Job 31 in the BOHNTLTAL

Job 31 in the BOILNTAP

Job 31 in the BOITCV

Job 31 in the BOKCV

Job 31 in the BOKCV2

Job 31 in the BOKHWOG

Job 31 in the BOKSSV

Job 31 in the BOLCB

Job 31 in the BOLCB2

Job 31 in the BOMCV

Job 31 in the BONAV

Job 31 in the BONCB

Job 31 in the BONLT

Job 31 in the BONUT2

Job 31 in the BOPLNT

Job 31 in the BOSCB

Job 31 in the BOSNC

Job 31 in the BOTLNT

Job 31 in the BOVCB

Job 31 in the BOYCB

Job 31 in the BPBB

Job 31 in the BPH

Job 31 in the BSB

Job 31 in the CCB

Job 31 in the CUV

Job 31 in the CUVS

Job 31 in the DBT

Job 31 in the DGDNT

Job 31 in the DHNT

Job 31 in the DNT

Job 31 in the ELBE

Job 31 in the EMTV

Job 31 in the ESV

Job 31 in the FBV

Job 31 in the FEB

Job 31 in the GGMNT

Job 31 in the GNT

Job 31 in the HARY

Job 31 in the HNT

Job 31 in the IRVA

Job 31 in the IRVB

Job 31 in the IRVG

Job 31 in the IRVH

Job 31 in the IRVK

Job 31 in the IRVM

Job 31 in the IRVM2

Job 31 in the IRVO

Job 31 in the IRVP

Job 31 in the IRVT

Job 31 in the IRVT2

Job 31 in the IRVU

Job 31 in the ISVN

Job 31 in the JSNT

Job 31 in the KAPI

Job 31 in the KBT1ETNIK

Job 31 in the KBV

Job 31 in the KJV

Job 31 in the KNFD

Job 31 in the LBA

Job 31 in the LBLA

Job 31 in the LNT

Job 31 in the LSV

Job 31 in the MAAL

Job 31 in the MBV

Job 31 in the MBV2

Job 31 in the MHNT

Job 31 in the MKNFD

Job 31 in the MNG

Job 31 in the MNT

Job 31 in the MNT2

Job 31 in the MRS1T

Job 31 in the NAA

Job 31 in the NASB

Job 31 in the NBLA

Job 31 in the NBS

Job 31 in the NBVTP

Job 31 in the NET2

Job 31 in the NIV11

Job 31 in the NNT

Job 31 in the NNT2

Job 31 in the NNT3

Job 31 in the PDDPT

Job 31 in the PFNT

Job 31 in the RMNT

Job 31 in the SBIAS

Job 31 in the SBIBS

Job 31 in the SBIBS2

Job 31 in the SBICS

Job 31 in the SBIDS

Job 31 in the SBIGS

Job 31 in the SBIHS

Job 31 in the SBIIS

Job 31 in the SBIIS2

Job 31 in the SBIIS3

Job 31 in the SBIKS

Job 31 in the SBIKS2

Job 31 in the SBIMS

Job 31 in the SBIOS

Job 31 in the SBIPS

Job 31 in the SBISS

Job 31 in the SBITS

Job 31 in the SBITS2

Job 31 in the SBITS3

Job 31 in the SBITS4

Job 31 in the SBIUS

Job 31 in the SBIVS

Job 31 in the SBT

Job 31 in the SBT1E

Job 31 in the SCHL

Job 31 in the SNT

Job 31 in the SUSU

Job 31 in the SUSU2

Job 31 in the SYNO

Job 31 in the TBIAOTANT

Job 31 in the TBT1E

Job 31 in the TBT1E2

Job 31 in the TFTIP

Job 31 in the TFTU

Job 31 in the TGNTATF3T

Job 31 in the THAI

Job 31 in the TNFD

Job 31 in the TNT

Job 31 in the TNTIK

Job 31 in the TNTIL

Job 31 in the TNTIN

Job 31 in the TNTIP

Job 31 in the TNTIZ

Job 31 in the TOMA

Job 31 in the TTENT

Job 31 in the UBG

Job 31 in the UGV

Job 31 in the UGV2

Job 31 in the UGV3

Job 31 in the VBL

Job 31 in the VDCC

Job 31 in the YALU

Job 31 in the YAPE

Job 31 in the YBVTP

Job 31 in the ZBP