Revelation 18 (BOICB)

1 Mgbe ihe ndị a niile gasịrị, ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ ka o si nʼeluigwe na-arịdata. E nyere ya ikike dị ukwuu, ebube ya mekwara ka ihe jupụta nʼụwa. 2 O ji olu dị ike tie mkpu,“ ‘Ọ daala! Ọ daala! Babilọn Obodo Ukwu ahụ adaala!’Ọ ghọọkwala ọgba obibi ndị mmụọ ọjọọnʼebe nzukọ mmụọ ndị ahụ na-adịghị ọcha,nʼebe nzukọ ụmụ nnụnụ rụrụ arụnʼebe nzukọ ụmụ anụmanụ niile na-adịghị ọcha na ndị rụrụ arụ. 3 Nʼihi na mba niile aṅụọlasite na mmanya ọnụma nke ịkwa iko ya.Ndị eze nke ụwa sokwaara ya kwaa iko,ndị na-azụ ahịa nʼụwa aghọkwaala ndị ọgaranya site nʼoke ịba ụba nke ya.” 4 Mgbe ahụ, anụkwara m olu ọzọ si nʼeluigwe na-akpọ oku na-asị,“ ‘Ndị m, sinụ nʼime ya pụta,’ka unu ghara iketa oke na mmehie ya,ka unu gharakwa iketa oke ahụhụ ya. 5 Nʼihi na mmehie ya amụbaala ruo eluigwe.Chineke echetakwala ajọ omume ya niile. 6 Mesonụ ya mmeso dịka o si meso unu.Kwụghachinụ ya ụgwọ mmaji abụọ maka ihe o mere.Gwakọọrọnụ ya mmaji abụọ nʼime iko mmanya ahụ nke ọ gwakọọrọ ndị ọzọ. 7 Nye ya ọtụtụ mmekpa ahụ na obi iludịka ndụ otuto, nʼime onwe ya obi ụtọ nke o nyere onwe ya.Ọ na-ekwu nʼobi ya na-asị,‘Abụ m eze nwanyị nọ nʼelu ocheeze m.Abụghị m nwanyị di ya nwụrụ,iru ụjụ ọbụla adịghị nye m.’ 8 Nʼihi nke a, ihe ntaramahụhụ ya ga-abịakwasị ya nʼotu ụbọchị,ọnwụ na iru ụjụ nke ọnwụ na-eweta, na ụnwụ.A ga-eji ọkụ rechapụ ya,nʼihi na Onyenwe anyị Chineke onye na-ekpe ya ikpe, dị ike. 9 “Ndị eze nke ụwa, ndị soro ya kwaa iko, ma bie ndụ ọchịchọ ọjọọ ya, ga-akwa akwa, ruo ụjụ nʼihi ya, mgbe ha ga-ahụ anwụrụ ọkụ nke ịkpọ ọkụ ya. 10 Ha ga-eji oke egwu guzo nʼebe dị anya, kwaa akwa nʼihi ntaramahụhụ ya sị,“ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, Babilọn, Obodo ukwu a maara aha yagị Babilọn, obodo e ji ịdị ike maara.Nʼotu ntabi anya, ikpe nke gị na-abịa.’ 11 “Ndị ahịa nke ụwa ga-akwa akwa ruokwa ụjụ nʼihi ya, nʼihi na ọ dịkwaghị onye na-azụ ihe ahịa ha ọzọ. 12 Ngwa ahịa ọlaedo gị, na ọlaọcha, na ọla e ji achọ mma na nkume oke ọnụahịa, ezi akwa ọcha, na akwa uhie uhie, na akwa lọrịlọrị, na akwa odo odo, osisi niile na-esi isi ọma, ihe niile e ji ọdụ enyi mee, ngwa ahịa niile e ji osisi niile dị oke ọnụahịa mee, bronz, igwe na nkume mabụl. 13 Ha na ụda sinamọn na mmanụ otite nke ọkpụrụkpụ eso osisi na-esi isi ụtọ, máá na frankisens, mmanya na mmanụ oliv, ụtụ ọka na wiiti, ehi na atụrụ, ịnyịnya na ụgbọala agha, na ndị na-ere mmadụ ibe ha dịka ohu, na ahụ mmadụ na mkpụrụobi mmadụ. 14 “Ha ga-asị, ‘Mkpụrụ ndị ahụ niile nke na-agụ mkpụrụobi agụ e sitela nʼebe ị nọ gabiga. Ihe ọma niile i ji ebi ndụ, na ihe oke ọnụahịa niile i ji azụ afọ gị, efunarịla gị. Apụghị ịchọtakwa ha ọzọ mgbe ọbụla.’ 15 Ndị ahịa ahụ bara ọgaranya site nʼaka ya, ga-anọ nʼebe dị anya, nʼihi oke egwu nke ntaramahụhụ ya, na-eru ụjụ, na-ebesikwa akwa ike. 16 “ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, obodo ukwu ahụ,nke e yikwasịrị ezi akwa ọcha, nke na-acha odo odo na ọbara ọbaranke nya ihe ịchọ mma nke ọlaedo, nkume dị oke ọnụahịa dị iche iche na nkume pieal dị iche iche. 17 Nʼotu awa a ka a lara oke akụ niile ndị a nʼiyi.’“Ndị niile nwee ụgbọ na-aga nʼoke osimiri, na ndị na-akwọ ụgbọ ndị ahịa nʼoke osimiri, na ndị niile na-eso ụgbọ mmiri ga-anọ nʼebe tere anya, 18 na-eti mkpu mgbe ha ga na-ele anya na-ahụ anwụrụ ọkụ na-ala elu site nʼire ọkụ ya na-asị, ‘Olee obodo ọzọ dịka obodo ukwuu a?’ 19 Ha ga-ekpokwasị aja nʼisi igosi obi ọjọọ ha na-eti mkpu akwa na-asị,“ ‘Ahụhụ, Ahụhụ dịrị gị, obodo ukwu a maara aha yaebe ndị niile nwere ụgbọ mmiri na-aga nʼosimirighọrọ ndị ọgaranya site nʼakụ dị nʼime ya.Ma ugbu a, nʼotu ntabi anya, ihe niile dị nʼime ya bụ ihe a laara nʼiyi.’ 20 “Ma gị eluigwe, ṅụrịa ọṅụ nʼihi ihe a dakwasịrị ya,unu ndị nsọ, ṅụrịakwanụ ọnụ,unu ndị amụma na ndị ozi, ṅụrịakwanụ ọnụ.Nʼihi na Chineke ekpeela ya ikpenʼihi mmeso ya megide unu.” 21 Mgbe ahụ, otu mmụọ ozi dị ukwuu tụtụlitere otu nkume nke dịka nkume igwe nri, tụba ya nʼime oke osimiri, na-asị,“Otu a ka a ga-esi tufuoBabilọn obodo ukwu ahụ,agaghị ahụkwa ya ọzọ. 22 Ọ dịghị mgbe ọzọ ụzụ egwu ga-adị nʼebe ahụ.Agaghị anụkwa olu ọja na une na ụbọ akwara na nke ndị na-afụ opi ike nʼime gị ọzọ.Aghaghị ahụ onye ọrụ ǹka ọbụlanʼime gị ọzọ.Agaghị anụkwa ụzụ nkume igwe nrinʼime gị ọzọ. 23 Ìhè nke sitere nʼoriọnaagaghị acha nʼime gị ọzọ.Olu obi ụtọ nke nwoke na nwanyịna-alụ di na nwunye agaghị adịkwa.Ndị mgbereahịa gị bụ ndị a ma ama nʼelu ụwa,ọ bụkwa mgbaasị gị ka e ji duhie mba niile nke ụwa. 24 Nʼime ya ka a hụrụ ọbara ndị amụma niile, na nke ndị nsọ niile,na nke ndị ọzọ ahụ niile e gburu nʼụwa.”

In Other Versions

Revelation 18 in the ANGEFD

Revelation 18 in the ANTPNG2D

Revelation 18 in the AS21

Revelation 18 in the BAGH

Revelation 18 in the BBPNG

Revelation 18 in the BBT1E

Revelation 18 in the BDS

Revelation 18 in the BEV

Revelation 18 in the BHAD

Revelation 18 in the BIB

Revelation 18 in the BLPT

Revelation 18 in the BNT

Revelation 18 in the BNTABOOT

Revelation 18 in the BNTLV

Revelation 18 in the BOATCB

Revelation 18 in the BOATCB2

Revelation 18 in the BOBCV

Revelation 18 in the BOCNT

Revelation 18 in the BOECS

Revelation 18 in the BOGWICC

Revelation 18 in the BOHCB

Revelation 18 in the BOHCV

Revelation 18 in the BOHLNT

Revelation 18 in the BOHNTLTAL

Revelation 18 in the BOILNTAP

Revelation 18 in the BOITCV

Revelation 18 in the BOKCV

Revelation 18 in the BOKCV2

Revelation 18 in the BOKHWOG

Revelation 18 in the BOKSSV

Revelation 18 in the BOLCB

Revelation 18 in the BOLCB2

Revelation 18 in the BOMCV

Revelation 18 in the BONAV

Revelation 18 in the BONCB

Revelation 18 in the BONLT

Revelation 18 in the BONUT2

Revelation 18 in the BOPLNT

Revelation 18 in the BOSCB

Revelation 18 in the BOSNC

Revelation 18 in the BOTLNT

Revelation 18 in the BOVCB

Revelation 18 in the BOYCB

Revelation 18 in the BPBB

Revelation 18 in the BPH

Revelation 18 in the BSB

Revelation 18 in the CCB

Revelation 18 in the CUV

Revelation 18 in the CUVS

Revelation 18 in the DBT

Revelation 18 in the DGDNT

Revelation 18 in the DHNT

Revelation 18 in the DNT

Revelation 18 in the ELBE

Revelation 18 in the EMTV

Revelation 18 in the ESV

Revelation 18 in the FBV

Revelation 18 in the FEB

Revelation 18 in the GGMNT

Revelation 18 in the GNT

Revelation 18 in the HARY

Revelation 18 in the HNT

Revelation 18 in the IRVA

Revelation 18 in the IRVB

Revelation 18 in the IRVG

Revelation 18 in the IRVH

Revelation 18 in the IRVK

Revelation 18 in the IRVM

Revelation 18 in the IRVM2

Revelation 18 in the IRVO

Revelation 18 in the IRVP

Revelation 18 in the IRVT

Revelation 18 in the IRVT2

Revelation 18 in the IRVU

Revelation 18 in the ISVN

Revelation 18 in the JSNT

Revelation 18 in the KAPI

Revelation 18 in the KBT1ETNIK

Revelation 18 in the KBV

Revelation 18 in the KJV

Revelation 18 in the KNFD

Revelation 18 in the LBA

Revelation 18 in the LBLA

Revelation 18 in the LNT

Revelation 18 in the LSV

Revelation 18 in the MAAL

Revelation 18 in the MBV

Revelation 18 in the MBV2

Revelation 18 in the MHNT

Revelation 18 in the MKNFD

Revelation 18 in the MNG

Revelation 18 in the MNT

Revelation 18 in the MNT2

Revelation 18 in the MRS1T

Revelation 18 in the NAA

Revelation 18 in the NASB

Revelation 18 in the NBLA

Revelation 18 in the NBS

Revelation 18 in the NBVTP

Revelation 18 in the NET2

Revelation 18 in the NIV11

Revelation 18 in the NNT

Revelation 18 in the NNT2

Revelation 18 in the NNT3

Revelation 18 in the PDDPT

Revelation 18 in the PFNT

Revelation 18 in the RMNT

Revelation 18 in the SBIAS

Revelation 18 in the SBIBS

Revelation 18 in the SBIBS2

Revelation 18 in the SBICS

Revelation 18 in the SBIDS

Revelation 18 in the SBIGS

Revelation 18 in the SBIHS

Revelation 18 in the SBIIS

Revelation 18 in the SBIIS2

Revelation 18 in the SBIIS3

Revelation 18 in the SBIKS

Revelation 18 in the SBIKS2

Revelation 18 in the SBIMS

Revelation 18 in the SBIOS

Revelation 18 in the SBIPS

Revelation 18 in the SBISS

Revelation 18 in the SBITS

Revelation 18 in the SBITS2

Revelation 18 in the SBITS3

Revelation 18 in the SBITS4

Revelation 18 in the SBIUS

Revelation 18 in the SBIVS

Revelation 18 in the SBT

Revelation 18 in the SBT1E

Revelation 18 in the SCHL

Revelation 18 in the SNT

Revelation 18 in the SUSU

Revelation 18 in the SUSU2

Revelation 18 in the SYNO

Revelation 18 in the TBIAOTANT

Revelation 18 in the TBT1E

Revelation 18 in the TBT1E2

Revelation 18 in the TFTIP

Revelation 18 in the TFTU

Revelation 18 in the TGNTATF3T

Revelation 18 in the THAI

Revelation 18 in the TNFD

Revelation 18 in the TNT

Revelation 18 in the TNTIK

Revelation 18 in the TNTIL

Revelation 18 in the TNTIN

Revelation 18 in the TNTIP

Revelation 18 in the TNTIZ

Revelation 18 in the TOMA

Revelation 18 in the TTENT

Revelation 18 in the UBG

Revelation 18 in the UGV

Revelation 18 in the UGV2

Revelation 18 in the UGV3

Revelation 18 in the VBL

Revelation 18 in the VDCC

Revelation 18 in the YALU

Revelation 18 in the YAPE

Revelation 18 in the YBVTP

Revelation 18 in the ZBP